Etu ndị ọwụwa-anyanwụ si mee 'Ụbọchị Biafra' ụnyaahụ

Ebe foto si, Emmanuel Izuchukwu
Ụbọchị Mee 30 nke 1967 bụ ụbọchị Chukwuemeka Ojukwu kwuru na mba ọzọ akpọrọ Biafra. Ụbọchi ahu bụkwa oge ndị di icheiche na-akwado Biafra wepụtara ka ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ ha iji cheta mbido Biafra na ndị nwụrụ n'agha agafeela, mana ndị mmadụ e gere ha ntị?
N'afọ a, maka mmachị ndị gọomentị machịrị Indegineous People of Biafra (Ipob) na ọchi cho a na-acho onyeisi ha bu Nnamdị Kanu mere ka ndi mmadụ tụwa anya etu emume ncheta Biafra ga-adị.
Lee otu ụbochị ahụ siri ga na steeti dị icheiche na ụwụwa anyanwu Naịjirịa:
N'Enugwu steeti
Ụfọdụ ndị nọ n'ụlọ ebe ndị ọzọ kwụdosiri ike ma mepee ụlọ ahịa ha ebe ndị ọrụ bekee gakwara ọrụ.
Ụlọakụ gbapere ebe ụlọọrụ ndi gọọmentị nọkwa ọrụ.
Ụfọdụ ahịa gbapere, mana Ọgbete, bụ nnukwu ahịa n'Enugwu azụghị.
Nsụka esoghi mee ya bụ nọrọ n'ụlọ.


N'Abịa steeti
Ebe ndị bi n'Aba kwere nọrọ n'ụlọ, ndị bi n'Umuahia bụ isi obodo steeti ahụ gawaara onwe ha ka e nweghị ihe na-eme.
Ndị ụlọakụ na ndị ọrụ bekee mepere n'Umuahia.

Ebe foto si, Akachi Okoro

Ebe foto si, Emmanuel Izuchukwu
N'Anambra steeti
N'agbanyeghị na ndị nọ n'ọchịchị n'Anambra nyere iwu sị na onye ọbụla ga-aga ọrụ ya etu o kwesịrị, ndị mmadụ egeghị ha ntị ma nọrọla onwe ha n'ụlọ.
Nnewi na Onịca sonyere na nọrọ n'ụlọ a, mana Ọka, bu isi obodo Anambara, esonyeghi ruo n'isi.

Ebe foto si, Tonie Iwoba

Ebe foto si, Tonie Iwoba
N'Imo steeti
Na steeti niile dị n'ala Igbo, Imo steeti so n'ebe ọtụtụ ndị mmadụ ejịghị ị nọ n'ụlọ were mee emume ncheta Biafra.
Kọmishọna ndị uweojii kwuru na e nweghị ihe dị otu ahụ mere n'Imo steeti.

Ebe foto si, Vivian Duruaku

Ebe foto si, Vivian Duruaku
Na Rivas steeti
Ụfọdụ ahịa na Rivas steeti emepeghị, mana ụlọakụ na ndị ọzọ zụrụ ahịa.


Ebe foto si, Eze Ndu
N'Ebonyi steeti
N'ọtụtụ akụkụ Ebonyi steeti ndi mmadu putara etu ha na-eme na mbụ maka na gọvanọ ha bụ Dave Umahi nyere iwu sị na onye ọbụla ga-agara onwe ha mkpa ha ma gakwaa ọrụ ha etu o kwesịrị.
Mana ihe akara ndi Radio Biafra dere na Twitter na-atu aka na o nwere ndị sara oku ndị nkwado Bịafra ma mekwa etu ha kwuru.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Lee etu osiri ga ụnyaahụ:

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










