EFCC anwụchiela aka chịbụrụ Kaduna Steeti

Ebe foto si, Magu's facebook page
Aka chịburu Kadụna steeti bụ Ramalan Yero, so na ndị EFCC nwụchikọrọ na Kaduna ụnyaahụ ma kpọsa ha na nga ka ha zara oku iza ọnụ ha banyere etu aka ha siri dị na mmerụaka ego PDP jiri me ndọrọndọrọ nke 2015.
Ndị ọzọ anwụchikọrọ bụ onye bụbụ onyeisi pati anọghi n'ọchịchị ugbua bụ nke akpọrọ Peoples Democratic Party (PDP) nke Kaduna bụ Abubakar Gaya- Haruna; Onye bụbụ ode akwụkwọ Kaduna steeti bụ Hamza Ishaq, nakwa onye bụbụ Minista Nuhu Somo Way.
Maazị Yero bụbụ onye ndị EFCC na-nyocha maka ebubo na aka ya dị na nkekọrịta nde 750 PDP jịri eme ndọrọndọrọ ntụlịaka 2015.
Yero na mmadụ atọ a zara azịza n'ime izuụka gara aga, ma binyekwa aka n'ime ụfọdụ akwụkọ mmetụtara ndị a na-enyocha enyocha mana a hapụrụ ha ka ha laa be ha.
Mana, ka ha gara ụlọ ndị EFCC dị na Kaduna, ekweghi ka ha la makana ha ga-aga ụlọikpe ịzara ọnu ha tata.
Yero na ndi ọzọ ahu nọbụ na-aga ụlọorọ ndị EFCC ahụ kamgbe n'ọnwa ole na ole gara aga.
Onye EFCC kwuru na a ga-akpụpụ ha ụlọikpe taa.
Cheta na ụnyaahụ ndị EFCC wetara mmeri n'ikpe nke onye na-achịbụ Taraba steetị bụ Jolly Nyame maka nrụrụ aka omere.
Maazị Nyame ga-anọ na mkpọrọ afọ 14.
Ikpe a mara Nyame nwereike inyere ndị pati na-achị aka maka ime ka ndị mmadụ hapụ ị na-ekwu na ha adịghị enweta mmeri ọbụla ma agha ha na-ebuso mpụ na awụwọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










