"Ịgba egwu Salsa zọrọ ndụ m" - Emeka Adindu

Aha onyonyo, "Ịgba egwu Salsa zọrọ ndụ m" - Emeka Adindu

Onye nkuzi egwu Salsa bụ Emeka Adindu agwaala BBC Igbo etu egwu Salsa si zọ ndụ ya.

O kwuru na ọ bụ mmetọ n'ụzọ mmekọ ahụ ọ gabigara mgbe ọ bụ nwata mere ka o malite ịche echiche ịgbu onwe ya ka o ji gbakwuru Salsa.

"A chọrọ m ịkọ akụkọ m ka ndị nne na nna anyị were mụta akọ n'ebe ụmụaka ha nọ" ka o kwuru.

Ugbua o kwuru na o ji akara aka a enyere ndị ọzọ obi ha na-ada mba aka.

Lee ihe niile o kwuru n'ime ihe onyonyo a.

Akụkọ a si n'aka Jessica Nwankwo na Vining Ogu.