"Ihe anọ ọ dị m ka ya bụrụ na m mabu maka inye nwa ara"

Inye nwa sọsọ ara ọnwa isii mbụ ya n'ụwa ga-eme ka ọ too ọfụma ma gbasie ike n'akọ n'uche

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Inye nwa sọsọ ara ọnwa isii mbụ ya n'ụwa ga-eme ka ọ too ọfụma ma gbasie ike n'akọ n'uche
    • Onye dere ya, Lu Yang
    • Ndị mere akụkọ a, BBC World Service

Agara m ebe nkụzi tupu a mụọ nwa, lee ara a dụrụ adụ, akpa nra onye na-enye nwa ara- akwadozuola m dịka nwaanyị na-enye nwa ara.

Mana abalị abụọ m mụchara nwa, mmiri ara na-atụ kpọm kpọm. Agbalịrị m ịhịa aka, iri nrị nwere abụba, aṅụrụ m mmiriara ehi n'uju.

Mana ka abalị atọ gachara, onye 'midwife' nyere m iwu m mụ lọghachi n'ụlọgwụ n'ihi na agụ na-egbu nwa ọhụrụ m."

O siri ike

Nne na nwa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Í nye nwa ara: Ihe a na-atụ anya nakwa ihe na-eme ugbua

Mgbe ha kwụnyere igwe e ji amịpụta ara n'ụlọọgwụ mana kama mmiri ara, ihe gbapụtara bụ ọbara.

Ihe m nọ na-eche bụ: "Kedụ ihe na-eme m? Ọ bụ na-ahụ anabataghị ịbụ nne?" Ihe mere bụ na nwa m na-amịsị ara ike iji mịta mmiri ara nke mere ka ọnụara m biwachaa.

Ọ dị m ka ya bụrụ na m m ma na inye nwa ara abụghị ihe na-eme re onwe ya. Ọ bụ a na-amụ, a na-amụta. Ịna-enye nwa ara, ị na-amụta ụzọ ị ga-eji eme ya ya ọ daba. Mana ọ bụghị ihe dị mfe, ụfọdụ ọ na-afụ ụfụ.

Ọ bụ ọsọ onye na- agbara onwe ya

Nne na nwa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọrụ dị n'ebe ụmụaka amụrụ ọhụrụ nọ

Mgbe ahụ doro m, nwa m ṅụwa ara, ahụ na-ahụzị ụdị mmiri mmiri dị icheiche oge niile.

An anaghị m enwe ohere ịrahụ ụra ọfụma, ma ya fọdụ ịsa ahụ maọbụ inyo enyo. Ịpụ apụ abụghị okwu a na-ekwute ekwute: "Kedụ ihe ndị agbataobi ga-ekwu? Keddụ ihe ndị enyi ga-ekwu?"

Ebe ndị na-amasịbu m ị ga abụghịzi ebe m nwere ike ịga n'ihi na anaghị m anọkwata inye nwa ara n'ọha.

Ana m eche na m ga-anọ n'etiti abalị, naanị mụ na nwa m, ka ndị ụwa chezọrọ.

Ọrịa oke echiche (depression) jidere m, ahụghị ony mkọsara na enyemaka

Ọ dị m ka ya bụrụ na m mara mkpa ọ dị ilekọta onwe m anya dịka m na-elekọta nwa m.

Nne ahụ siri ike ma nwekwa ezumike ka nke oke echiche ji maọbụ nke obi erughị ala mma.

Obi ịma ikpe anaghị apụ apụ

Nwaanyị na-enye nwa ara

Ebe foto si, Getty Images

Oge e nyere nwa m my baby nri mbụ(mmiri ara ehi) n'ụlọgwụ, ọ rahụrụ ụra ọtụtụ awa.

Echetara m na anọ m ebe ahụ kpebire onwe n'ime obi na m chọọ ịrahụ ụra, aga m enye nwa m ara ehi kama inye ya ara.

O teghị aka obi m mawa onwe m ikpe. Ara ehi nwere ihe ọ na-ahapụ n'ire nwa m-isi ya na-atụgharị afọ. Ọ dị nọọ ka m na-enye nwa nri cherewere hapụ mmiri ara na-enye ihe na-ahụ.

Oge ọbụla m dara mba, obi ịma ikpe ejide m: "Akara m agbalị. Ọ bụrọgodị ị wọ onwe m ụra."

Ọ dị m ka ọ bụrụ na m mara na obi ịma ikpe anaghị ala ala. Mana ọ bụghị ihe enweghị ihe na-ebute ya.

Onye ọbụla ga-ahọrọ nke kara ya mma; mmiri ara ka na ọ bụghị ya.

Obi ịma gị ikpe bụ ihe na-eme eme- ọ bụ ụgwọ onye ọbụla bụ ezi nne na-agabi ga ọbụghị ajọ nne.

Chọọ enyemaka

Nne na nwa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ị ga-egoteli ihe ị ga-eji nye papụta mmiri ara ghara imerụ ọnụ ara gị ahụ

Ị nye nwa ara bụ nnukwu ahịa makana mgbe ọ bụla nwata kpọrọ etuketu enwere nke akwọrọ aka wee pịpụta dọwa n'ụlọahịa i nyere nwatakịrị aka.

Nwa na-amị mmiri ara ehi

Ebe foto si, Getty Images

Inye nwa ara bụ mkpebi mmadụ na-enwere onwe ya. Echere m na ọ bụ ihe nne ọbụla kwesịrị ime, mana ọ bụụ na imenwughị ya, maọbụ na ịchọghị ime ya, ọ pụtaghị na ịbụ ajọ nne.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: