Uloma Rochas: 'Ngagharịiwe ụmụnwanyị Imo mere ziri ezi'

Ebe foto si, FCC Jones
Onye na-ekwuchitere Uche Nwosu bụ Jones Onwuanyasoanya ekwuola na ngagharịiwe nke ụmụnwanyị mere n'Owere n'ụbọchị Tuzde iji tie mkpu maka ụra a mara Uloma Rochas Nwosu, ziri ezi.
Uloma Nwosu bụ nwa Rochas Okorocha ma bụụkwa nwunye onye zọrọ ọkwa gọvanọ Imo Steeti na Pati "Action Alliance" bụ Uche Nwosu.
Ụfọdụ ụmụnwanyị mere ngagharịiwe iji kwuputa mwute ha banyere otu ndị na-arụrụ gọọmenti Emeka Ihedioha si kpụọ Uloma Nwosu aka ntị abalị ole na ole gara aga.
Oriakụ Nwosu kwuru na ndịọrụ gọọmentị mara ya ụra ma kpọọ ya aha ọjọọ dị icheiche oge ha bịara ebe ọ na-ere ahịa ibukọrọ ngwongwo ha sị na o zupuru mgbe nna ya bụ Rochas Okorocha nọ n'ọchichi.

Ebe foto si, FCC Jones
Ụmụnwanyị ahụ mere ngagharịiwe rịorọ nwunye onyeisiala bụ Aisha Buhari ka o tinye ọnụ n'okwu ma kwụsị nleda anya gọọmentị Ihedioha na-eleda ụmụnwanyị steeti ahụ.
Mgbe BBC Igbo gbara Jones ajụjụọnụ, o kwuru na ihe ahụ e mere Ụlọma adịghị mma ịnụ na ntị ma ncha.
O kwuru na "ihe (Gọvanọ) Ihedioha mere jọgburu onwe ya."
"Ụmụnwanyị ahụ mere ihe ha kwesiri ime dịka ụmụnwanyị.
"Onye ọbụla kwesịrị itinye ọnụ kagbuo ihe a Ihedioha mere."

Ebe foto si, FCC Jones
BBC kpọtụụrụ Chibuike Onyeukwu na Steve Osuji bụ ndị na-ekwuru gọvanọ Emeka Ihedioha, mana ha abụọ azaghị ekwentị ha maọbụ zaghachi ozi e zigaara ha.
Oge ya bụ ihe mere ọhụrụ, BBC Igbo kpọrọ Jasper Ndubuaku bụ onyeisi kọmiti na-ahụ maka iweghachị ihe gọọmentị e zuru ezu, o wee kwuo na o nweghị onye ọbụla mara Uloma ura.
Mana ihe nkiri Uloma ziteere anyị gosiri ebe ọ dịka mmadụ amara ya ụra.
Lee ihe nkiri ahụ ebe a:
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:










