Okorocha: Uche nwosu awụfeela n'otu ndọrọndọrọ ọzọ

Ebe foto si, Uche Nwosu
Akụkọ n'ewuewu bụ na Uche Nwosu a hapụla pati APC banye otu Action Alliance (AA).
Onye dị nso n'ebe Uche Nwosu na-achọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC Igbo na ọ hapụru APC gawa zie AA, ọ gwara ọha etu a mgbe o rituru ụgbọelu sị Abuja lọta.
O kwuru na o mere nke a n'ihi ịhụnanya o nwere n'ebe Imo steeti nọ karịa ndị ntoroọbịa ya.
Onye a gaa n'ihu kwuo na Uche Nwosu ga-akwado Buhari n'ịzọ ọkwa ọchịchị onyeisiala n'afọ 2019.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị APC n'Imo steeti agbasola Uche Nwosu
N'aka ọzọ ọnụ na-ekwuchitere APC n'Imo steeti bụ FCC Onwuasoanya Jones gbara arụkwaghị m n'ọrụ ya, wee gbaso Uche Nwosu site n'ibu onye isi nchịkọta achunta vootu.








