DSS anwụchiela Nwaanyị sị na ya bụ Aisha Buhari

Ebe foto si, Punch
Ndị uweojii nzuzo nke a kpọrọ DSS n'aha ịchafụ kwuru na nwaanyị a kpọrọ Amina Mohammed, maọbụ "Justina Oluoha", na "Amina Villa" dịka e jiri mara ya tụburu asị sị na ya bụ nwunye gọvanọ Kogi steeti were si ụzọ ahụ mịbata n'oche ọchichị Aso Rock n'Abuja.
Nwaanyị ahụ gara n'ihu, ịkpọ ndị mmadụ oku ka ha bịa na nwunye onyeisiala na-akpọ ha.
Mana n'ọgbakọ a kpọrọ ndị ntaakụkọ nwaanyị ahụ eboro ebubo gọọ sị na 'ọ bụ asị,"
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii nzuzo bụ Peter Afunanya,kwuru na nwaanyị ahụ kpara arụ ahụ n' ọnwa Novemba afọ 2017, oge nwunye onyisiala bụ Aisha Buhari gara njem.
Amina Mohammed jiri aghụghọ napụ otu onye ojiegoachụego a kpọọ Alexander Chika Okafor ego karịrị puku nari paụd anọ(($414,000, £323,000)) maka ụlọ dị na Legos.

Ebe foto si, Aisha Buhari Facebook
Mr Afunanya kwuru na "nyocha DSS mere gosiri na o nweghị ka aka nwunye onyeisiala siri dị na ya bụ nkata a kpara."
O kwuru na Mohammed kpanwuru ụdị ajọ agwa a n'ihi na anaghị etinye anya na mmiri enyocha ndị ọbịa dị oke mkpa dịka nwunye gọvana, ndị mịnịsta nakwa ndị welitere isi na ha bịa n'ụlọ onyeisiala.
Onye ntaakụkó BBC bụ kwuru na ya bụ ihe bụ ọ gbara Igbo gharịị n'ihi na uweojii nzuzo nakwa ndị uweojii nkiti na-eche Aso Rock ka agụ na-eche nwa ya; Ndị na-arụ ebe ahụ nwechara akwụkwọ njirimara nke nwere akara aka ha n'ime ya(biometrics), ebe onye ọbụla batara na-edebanye aha n'akwụkwọ.
Ụzọ atọ ị ga-esi amata onye ji aha ndị mmadụ atụrụ mmadụ ego
Ọkachamara n'ihe gbasara nchekwa bụ Patrick Agbambu, kọwara na ọ bụ agwa mmadụ ka e ji ama ma ọ bụ onye na-asị na ọ bụ onye ọ bụghị.
Lee ihe atọ dị mkpa ọ rụtụrụ aka:
1. Ha anaghị enwe ndidi
Ha chọrọ ihe ha chọrọ inweta n'aka gị n'ọkụ n'ọkụ n'ihi na ha achọghị ka i nwee ohere mee nchọpụta banyere ha.
2. Ha anaghị achọ ka gị na ha hụ ihu na ihu
Gbaa mbọ mee ka gị na onye ahụ hụ ihu na ihu n'ihi na nke a bụ ihe ọ chọghị.
3. Ọ na-amasịkarị ha ịkpọ aha ndị nnukwu mmadụ
Ọ bụrụ na onye gị na ya na-aka ụka na-etu ọnụ na ya nnukwu mmadụ nke a maọbụ nke ọzọ bụ enyi maọbụ nwanne, nyoo ya enyo.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:









