2019 Election: Ndị nwere nkwarụ ga-esonye na ntuliaka - INEC

Ebe foto si, Emeka Ononamadu
Onyeisioche INEC Enugwu bụ Emeka Ononammadu ekwuola na INEC adịla njikere ihu na onye ọbụla nwere nkwarụ bụ onye nwere akwụkwọ ikike eji atụ vootu were ike soro mee ntuliaka 2019.
Ononamadụ kwuru nke a mgbe ya na BBC nwere nkparịta ụka ụbọchị Monde, Disemba atọ, 2018.
Ọ sị na ọrụ mbụ dị ha n'aka iji mejuputa nkwa a bụ ịme ọnụ ọgụ ndị niile nwere nkwarụ na Enugwu steeti, mata ebe ha bị, ụdị nkwarụ ha nwere na ihe ha maa gbasara ntuliaka a na-abịa.
O kwukwara na nke a "ga-enyere ha aka ịmata udi ihe ndị dị otu a chọrọ iji nyere ha aka mejuputa ebum n'obi ha maka atụm vootu 2019"
Maka ndị nwere nkwarụ n'aka
Ononamadu sị na INEC nyere ohere ịhapụ onye nwere nkwarụ aka ka ọkpọrọ onye ọtụkwasara obi iji nyere ya aka mee mbinye aka ahụ.
"Onye ndụ ahụ agaghị abụ onye amanyere amanye. Ọ ga-abụ onye ike dị n'obi ahụ họpụtara," dịka Ononamadu sịri kwuo.
Ọ sị na INEC na ọgbakọ ndị nwere nkwarụ ka na-enwe nzukọ iji mata ụzọ dị iche iche aga esị nyere ha aka.

Ebe foto si, AFP
Ndị kpuruisi
Ononamadụ sị na INEC ewepụtala akwụkwọ ikike nke ga nyere ndị kpuruisi aka ịme ntuliaka.
Ọnyeisioche a sị na INEC dị njikere ịnye ndị ike ndị n'obi ọzụzụ nke ga-eme ka ha nwee ike mee ya bụ ntuliaka.
Ọ sị na "ndị a nwere ọzụzụ ga-enyere ndị otu ha na-enweteghị ọzụzụ a aka."
INEC Enugwu na-akwado ọgbakọ pụrụiche iji gee ndị nwere nkwarụ dị iche iche ntị ka ha kwuo ụzọ ha che aga esi nyere ha aka n'atụm vootu 2019.
Ọgbakọ a ga-akpọtụ n'ụbọchị isii nke ọnwa Desemba n'Enugwu.
Ọ sị n'ọgbakọ a ga-eme ka ọnụ rụọ ndị ike dị n'obi n'okwu.
Ọnụ okwu ndị ike dị n'obi
N'aka ọzọ, David Obinna Anyaele bụ onyeisi ndị Centre for Citizens with Disability (CCWD) kwuru na agbanyeghị nkata ha ndị INEC kpara ihu na ndị nwere nkwarụ so mee ntuliaka, mana " ihe ha na ahụ anaghị eju ha afọ?
David sị n'uche ya "ọdịghịm ka ndị INEC ana agba mbọ ihu na ndị ike dị n'obi sọ mee ntuliaka 2019."
Ọmaraatụ na ihe mere na ntuliaka Osun steeti gosiri na ndị INEC ebughị ndị nwere nkwarụ na Naịjirịa n'obi, agbanyeghị ihe a kwere na-nkwa.
Ọ sịkwa na-agbanyeghị, na ndị ụlọọrụ ha bụ CCWD sọkwa INEC agbambọ ihụ na-emere ọnụọgụ isi ndị nwere nkwarụ na ụfọdụ steeti nke Enugwu so n'ime ha ka ha wee maka mkpa ha nwere bụ nke pụrụ igbochi ha ịtụ vootu.











