Inec chọrọ enyemaka EFCC na ntuliaka
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Inec na EFCC
Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ INEC arịọla EFCC ka ha soro lebanye anya n'akụnaụba ndị pati Naịjirịa na ndị otu ha na-azọ ndọrọndọrọ ọchịchị chọrọ iji achụnta vootu.

Ebe foto si, AFP
Idemmiri Anambara
Ka idemmiri na-enye ụfọdụ ndị bi n'Anambara nsogbu, kọmịshọna na-ahụ maka mgbasaozi na steeti ahụ bụ James Eze, kwuru na ya bụ idemmiri tara isi otu ụkọchukwu Katolik ka ọ na-achọ ịzọpụta enyi ya nwoke.
O kwuru na ihe a bụ ihe ịgba anyammiri nke ha na-agba mbọ igbochi ma na-arịọkwa ka Chukwu nyere ha aka.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Idemmiri Anambra ataala isi otu ụkọchukwu
Na mba ofesi,
Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ihe mberede ụgbọmmiri kpuru na Tanzania arịgoola narị na iri atọ na isii.

Ebe foto si, Stephen Msengi
Cheta na ụbọchị 20 nke ọnwa Septemba 2018 ka e bidoro na-achọ ihe karịrị mmadụ narị ka ụgbọmmiri ahụ bu ihe ruru mmadụ narị anọ kpuru n'elu osimiri Victoria.
N'egwuregwu,
Onye egwu Man City bụ Sergio Aguero, ekwuola na obi dị ya ụtọ ịgbatịkwu afọ ole ọ ga-anọ n'otu egwuregwu ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Nke a na-abịa dịka o tinyere aka n'akwụkwọ dọtịrị oge ya n'otu a ruo afọ 2021.
Naịjirịa
Onyeisiala Muhammadu Buhari emekwala Rotimi Amaechi bụ mịnịsịta okwu njem dịka onyeisi otu na-achụrụ ya nta vootu na ntuliaka 2019.

Ebe foto si, Getty Images
Amaechi bụkwa onyeisi mgbasaozi otu ahụ n'oge ntuliaka 2015 nke ha meriri were bata n'ọchịchị.
Ọzọ,
Ụlọọrụ na-ahụ maka ịkwụsị mgbere mmadụ bụ NAPTIP n'aha ịchafụ achụọla ụfọdụ ndị ọrụ ha na-achọ ịraba ụmụnwaanyị ndị ha napụtara ka ha na ha nwee mmekọ anụ ahụ.

Ebe foto si, AFP
Ha kwuru na ha chụrụ mmadụ isii ebe ha nyekwara otu onye ọzọ ezumike nka n'ike maka izupu akụkọ gbasara ụlọọrụ ahụ resaa ndị mmadụ.
Akụkọ mba ofesi
Amerịka enyela ndị agha China ntaramahụhụ maka na ha gotere ụgbọelu e ji alụ agha n'aka ndị Rọshịa.

Ebe foto si, Getty Images
Amerịka kwuru na azụmahịa ahụ mejọrọ mmachi ha machiri Rọshịa maka ihe Rọshịa mere na Ukren nakwa itinye aka na ntuliaka Amerịka.
N'egwuregwu,
Onye nkuzi ndị Arsenal bụ Unai Emery na-achị dịka eze n'asọmpi Europa League ebe Arsenal o kpotere goolu ka akwa.

Ebe foto si, Getty Images
Arsenal gbara otu FC Vorskla Poltava ọgbụ goolu anọ a satara abụọ ụnyaahụ n'asọmpi ahụ nyere Emery mmeri nke iri atọ na abụọ n'asọmpi Europa kamgbe ọrụ ya malitere.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:











