NAPTIP achụọla mmadụ isii chọrọ ị rabaa ụmụnwaanyị ha gbapụtara

Nwaanyị na-enye nwa ara

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ịtụ mgbere ahịa ụmụaka agbalitela n'ala ọwụwa anyanwụ Naijirịa

Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi mgbere mmadụ achụọla mmadụ isii maka mmehie site n'ịchụ ụmụnwaanyị ndị ha gbapụtara.

Ihe ndị ọzọ ha na-eme gụnyere ịresi ndị mmadụ akụkọ ịmeụlọ nakwa ịnyere ndị a nwụchiri aka ịgbalahụ nwuchi Naptip mere ha.

Ọnụ na-ekwuchitere Naptip bụ Stella Nzan kọwara ihe mere ha ji chụọ ndị ọrụ ahụ n'ike.

N'okwu ya "ọchụchụ ndị a bịara dịka e mechara nyocha imeụlọ dịka iwu hibere Naptip si kwuo"

Ebe Onyeisi Naptip bụ Julie Okah-Donli kwuru na mkpebi ịchụ ndị a n'ọrụ bụ iji kwụsị ndị ọzọ ịṅomi ndị ahụ kpara arụ.

Ka o si kwuo "ngalaba a dịrị Naịjirịa nakwa mba ndịọzọ mkpa ya mere n'uche anyị bụ na ndịọrụ anyị ga-agba mbọ ịso iwu anyị hibere".

Ọ bụrụ na ị chọrọ ị kpọtụrụ ndị NAPTIP maka okwu gbasara ndị na-agba mgbere mmadụ,nweta ha na: [email protected]+234703000020308002255627847

Ị chọkwa ịme mkpesa maka onyeọrụ NAPTIP nara gị aka azụ maọbụ nrụrụaka ọbụla ziga ozi na [email protected]