NAPTIP: O teela anyị na-achọ ndị na-eme mpụ a

Ebe foto si, InterPol
Ngalaba na-ahụ maka mgbochi mgbere mmadụ bụ NAPTIP n'aha ịchafụ agbachiela otu ụlọoriri na Abuja ma gbapụtakwa ụmụ agbọghọ ruru iri n'atọ.
Onyeisi nyocha a kpọrọ Josiah Emerole gwara BBC na ha nwụchiri ụmụ nwoke abụọ echere na ha na-agba mgbere ebe otu n'ime ha bụ onye na-achịkọta ụlọoriri ahụ.
Emerole si na "O toola aka anyị na-achọ ndi mere ihe ma na-enyocha akụkọ anyị nụrụ maka otu ụlọriri dị na Gwagwalada n'Abuja"
Ụfọdụ ndị na-agba mgbere na-eji ụlọọrịrị ahụ mee ebe nchekwa "ngwa mmadụ" ha
Ha kwuru na ha na-eme nyocha zuruoke tupu ha a kpụrụ ndị a ga-ba ụlọịkpe maka ebubo e boro ha.
Onyeisi NAPTIP ahụ kwuru na otoola aka a na-achụ otu onye n'ime ndị a nwụchiri.
Ụfọdụ ndị ọzọ na-ejikwa ebe ahụ ezo ụmụnwaanyị ha chọrọ ị buru ga mba Saudi Arabia.

Akụkọ ga-amasị gị










