NAPTIP anwụchiela ndị na-atụ mgbere ụmụaka na-aga Rọshịa

Ebe foto si, Getty Images
Ndị isi ọchịchị Naịjiria kwuru na ha anwụchiela ndị na-atụ mgbere ahịa ụmụaka ma azọpụta ụmụaka iri.
Ụmụaka ndị a gụnyere ụmụnwaanyị itoolu na otu nwoke.
Anwudere ndị ahịa iwu a mgbe ha na-achọ ị banye ụgbọelụ Tọki na Legọs fepu gawa Moscow dika ndị na-aga egwuregwu bọọlụ Iko Mbaụwa ka ndị nkwado.
NAPTIP nwudekwara onye uweojii na onye na-ahụ maka mgbochi ọrịa na-efe efe maka etu ha nyere ndị mbere ahịa ụmụaka aka n'ime ijem a.
N'ọdọ ụgbọelu, enyere ụmụaka ndị a akwụkwọ eji eme njem nke akpọrọ passport n'olu bekee nakwa ihe nhụba anya nke egwuregwu bọọlụ ka o were dịka ha na-eje ikiri Iko Mbaụwa na Rọshịa.
Onyeọrụ BBC akpọrọ Willie Ross kwuru na gọọmentị etiti adọla aka na nti ka ndị mmadụ kpachara anya makana ndị omekome jizi n'aha iko Mbaụwa ka ha were nweta akwụkwọ njem nye ụmụaka ha ga-eji tụọ mgbere.

Akụkọ ga-amasi gị:






