Anambra: Aka ndị uweojii akpara nwaanyị rere nwa ya

Ndị mmgbere mmadụ na Naịjirịa

Ebe foto si, Haruna Mohammed

Nkọwa foto, Itu mgbere ụmụaka bụ ihe na-ewu ewu ugbua na Naịjirịa

Na mgbede ụnyaahụ ka aka ndị uweojii n'Anambara steeti kpaara Oluchi Mba (28) bụ onye ha kwuru rere nwa ya ọ mụrụ mkpụrụ ụbọchị asaa gara aga n'Ogidi, Anambara steeti.

Oluchi bụ Onye Ikenga Ogidi hiri asaa nabọ resị Edith Obiakor (55) nwa n'ọnụ puku narị naịra atọ na iri ise (350,000.00) ma tụọ ụgha na ya bụ afọime pụrụ apụ.

Edith regherịrị ya bụ nwa resi ya ọgọ ya nwoke bụ Vitus Aniụno (50) bi na Fegge, Onisha.

Edith n'onwe ya bụ nke a matara ka onye na-atụ mgbere mmadụ bikwanụ na Nkpọ, Anambara steeti.

Vitus gopuru Edith ya bụ nwa n'ọnụ puku narị naịra isii na iri ise (650,000.00).

Ndị uweojii na Naịjirịa

Ebe foto si, Haruna Mohammed

Nkọwa foto, Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti

Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara steeti bụ Haruna Mohammed sị kwuo, "ndị niile a asaalarị asịsa gbasara ajọ agwa ha kpara ebe a napụtagoro ha nwa ahụ".

A ga-akpụpụ ha ụlọikpe mgbe adịghị anya.

Akụkọ ga-amasị gị