Kedụ ebe Kemi Adeosun nọ ugbua?

Ebe foto si, Reuters
Akụkọ na-arị ibe ya elu ugbua na-ekwu na Kemi Adeosun bụbu Minista na-ahụ maka ego ahapụla obodo Naịjirịa.
Ndị maara minista a nke ọma gwara ndị ọrụ akwụkwọ ntaakụkọ 'Premium Times na Guardian' na minista ahụ laghachiri mba Ịngland bụ ebe o si bịa malite ọrụ na Naịjirịa.
O kwuru na "Ụnyaahụ mgbe Adeosun gbarachara arụkwaghịm, onyeisiala Buhari na-abatara akwụkwọ ya, na ọ rụrụ ọrụ rue n'ime abalị.
Dịka o mechara nke a, o were ngwaọrụ ya nye odeakwụkwọ ministri na-ahụ maka ego bụ Isa Momoud Dutse ma lawa n'ụlọ ya.
N'ime awa ole na ole, ndị ọrụ nchekwa ya bịara buru ya gawa ọdọugbọelu Nnamdi Azikiwe dị n'Abuja bụ ebe ọ bara ụgbọelu hapụrụ Naịjirịa."

Ebe foto si, Getty Images
Mana onweghi ndị enyemaka ya kwere ekwu ma nke ọ bụ eziokwu ka ọ bụ asị.
Cheta na Kemi Adeosun gbara arụkwaghịm n'ihi ebubo na asambodo NYSC o ji arụ ọrụ bụ nke adịgboroja.
Tupu akụkọ na ọ hapụla Naịjirịa apụta , pati PDP kwuru site n'ọnụ onye odeakwụkwọ mgbasaozi ha na gọomenti etiti ezopụla Adeosun i ji mee ka ọ gbanarị ntaramahụhụ.










