Mmerụaka NYSC: Adeosun, APC ekwubeghi okwu

Ebe foto si, Getty Images
Minista na-ahụ maka ego na akụnaụba Naịjirịa bụ Kemi Adeosun ekwubeghị ihe ọbụla gbasara ebubo mmerụaka e boro ya maka asambodo NYSC ya.
Ndị ntaakụkọ 'Premium Times' depụtara na Adeosun ghọrọ aghụghọ maka asambodo NYSC ya n'ụbọchị Julaị 7.
Mgbe ụlọọrụ BBC kpọrọ minista Adeosun ịjụta ya maka ya bụ ebubo kamgbe a nụrụ akụkọ a, ọ zaghị ekwenti ya maọbụ depụta ihe ọbụla n'igwe soshal midia ya.
BBC gbakwara mbọ ịnụta okwu n'ọnụ ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchi APC.
Mgbe BBC kpọrọ onye nkwuchite ọnụ onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Femi Adesina, ọ sị ka e nyeruo ya elekere 12 nke ehihie tupu ọ zaa anyị ajụjụ gbasara mmerụaka a.
Anyị ga-eche ya ma wetekwara ụnụ ihe ọbụla ọ zara anyị mgbe ahụ.
Ihe a na-ekwu na soshal midia
Kamgbe ndị ntaakụkọ 'Premium Times' depụtachara maka mmerụka ahụ, ndị mmadụ na-etinye ya ọnụ na soshal midia ebe ọtụtụ na-agwa Adeosun ka o tinye akwụkwọ arụkwaghịm ma ọ bụrụ na ebubo a bụ eziokwu.
Ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP @OfficialPDPNig na-akpọku onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ka ọ chụọ ma nwụchie Adeosun maka mmerụaka a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Femi Fani-Kayode @realFFK kpọkukwara Adeosun ka o tinye akwụkwọ arụkwaghịm.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ayisha Osori @Naijavote bụ onye odee akwụkwọ a ma ama kwuru na ọ bụ ihe ihere ma ọ bụrụ na ndị ụlọ omeiwu enyochaghị Adeosun nke ọma tupu ewee ya n'ọrụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Onye na-akọwapụta ihe gbasara ọchichị na mmepe obodo bụ Dọkinta Joe Abah kwuru na ọ bụrụ eziokwu na Adeosun ghọrọ aghụghọ maka akwụkwọ NYSC ,ọ bụ iwu na-aga achụ ya n'ọru ma makwa ya ikpe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Anyị ga na-ewetere unu akụkọ a dịka o si aga.








