A chụọla onye Ndị uweojii gbagburu 'corper' n'ọrụ

Nigeria policeman don allegedly kill 23 year old youth corps member

Ebe foto si, Linda Igwetu

Nkọwa foto, Linda dey only 23-years-old wen she die

Ndị uweojii n'Abuja achụọla onye otu ha gbagburu Cynthia Angela Igwetu, agbọghọ ji otu afọ efe ala nna ya n'Abuja.

Kọmishọna ndị uweojii nke Abuja bụ Sadiq Bello kwupụtara nke a oge ọ na-akwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Fraide kwuru na a nwụchiri onye uweojii ganye oge a ga-akpịụpụ ya ụlọikpe.

Ụlọọgwụ Garki, nke di n'Abuja, zipuru ozi na-agọ na ọ bụghị eziokwu na ha enyeghi nwa agbọghọbịa ahụ bu mgbọ egbe bịa n'ụlọọgwụ ha ọgwụgwọ.

Nwa agbọghọbịa bụ Linda Nkechi Igwetu mechara nwụọ maka ọbara gụrụ ya n'ahụ site n'egbe onye uweojii gbara ya.

Igwetu kwesiri i so ndị yipuru uwe ndị NYSC bụ ndị ji otu afọ na-efe ala nna ha ụnyaahụ.

Akụkọ dị na soshal midia kwuru na ụlọọgwụ ahụ ekweghi inye Igwetu ọgwụgwọ ma ma ha ahụghị akwụkwọ si n'aka ndị uweojii.

Ụlọọgwụ a gara n'ihu sị na nke a bụ nnukwu asị.

Lee ihe ha dere na Bekee ebe a:

Garki hospital

Ebe foto si, Garki Hospital

Garki hospital

Ebe foto si, Garki Hospital

Mana nwanne nwaanyị onye a nwụrụ bụ Chinenye Igwetu gwara BBC na ọ bụ onye uweojii gbara ya egbe n'isi ụtụtụ (elekere atọ nke ụtụtụ) ka ọ na-alọta n'ụlọ ya.

O kwụrụ na ọ bụ ka Linda mechiri ọrụ ka ya na ndị enyi ya kpebiri ị ga zuo ike makana ọ fọrọ ọtụ ụbọchị ka ha fechaa ala nna.

Chinenye Igwetu sị na onye uweoji gbara ụgbọala bu ha egbe.

Ọ si na onye uweojii a si na ya mere nke a maka na ya nụrụ ka mmadụ tiri mkpụ n'ime ụgbọala a, nke mere ha jiri kpebie na ọ bu ndị ntọrọ na-agbafe.

Chineye Igwetu sị na ọ bụ naanị nwanne ya nọ n'azụ nwụrụ.

BBC gbara ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abuja bụ Anjaguri Manza ajụjụ ịmata ma akụkọ a ọ bụ eziokwu, nakwa onye uweojii aka ya dị n'ihe a.

Manza zara sị na ha 'na-eme nyocha maka ihe a".

Cheta na ụlọomeiwu nke ukwu tinyere ọnụ n'okwu a ụnyaahụ.