Anyị chọrọ ikpenkwụmọtọ - Ezinaụlọ 'Corper' uweojii gbagburu

Linda Angela Igwetu,

Ebe foto si, Linda Angela Igwetu/Facebook

Nkọwa foto, Ndị uweojii gbagburu Igwetu,nwata na-efe ala nna ya n'Abuja

Ezinaụlọ Igwetu Linda bụ nwata ahụ na-efe ala Naịjirịa ndị uweojii gbagburu taa n'Abuja ekwuola na ha achọrọ ikpe ziri ezi gbasara ya bụ okwu.

Nwanne ya bụ Amara Igwetu gwara BBC Igbo na ha anabataghị ihe ndị uweojii kwuru.

Akụkọ kwuru na onye uweojii gbagburu Igwetu n'Abuja ụnyaahụ bụ Wenezde, otu abalị tupu o soro ibe ya yịpụ uwe "corper" tata.

Ndị omeiwu ukwu nke Naịjirịa ekwekọrịtala na ha ga-etinye anya mee nchọpụta maka ihe butere ọnwụ nwaada Linda Angela Igwetu, bụ onye "corper" na-arụrụ Naịjirịa ọrụ n'Abuja.

Omeiwu Atai Aidoko, tinyere ọnụ n'okwu a site na usoro 42 na 52 nke iwu ji ndi ụlọomeiwu Naijirịa, were sị na ọ bụ mgbe nwaada na ndị enyi ya na-ala be ya ka a gbara ya egbe, nke mere e jiri buru ya gawa ụlọọgwụ Garki.

ụlọomeiwu

Ebe foto si, @Senatepresident

Ndị omeiwu kwekọrịtara na ha ga-enye ngalaba ha na-ahu maka egwuregwu na ndị ntoroọbịa ikike ka ha nyocha ọnwụ nwaada, ma nyekwa ngalaba ha na-ahụ maka ahụike ka ha nyocha ihe mere e jighị nye nwaada ọgwụgwọ mgbe e bu ya ga ụlọọgwụ.

Ha gakwara n'ihu gwa ngalaba na-ahụ maka uweojii ka ha ga chọpụta etu ihe a siri mee.

Ngalaba atọ a nwere izuụka atọ ka ha wepụta ozi nchọpụta ha.

Onyeisi ndị ụlọ omeiwu bụ Bukola Saraki sị: "Okwu abụọ dị ebe. Otu bụ ihe mere ihe jiri me? Kedu etu onye uweojii ga-eji mehie maọbụ gbaa egbe etu ọ ga-eji bute onwu nwaada a?

"Nke abụọ bụ na anyị binyere aka n'iwu nke ga-ahụ na onye ọbụla bụ mmerụ ahụ mgbọ ga-anata ọgwụgwọ, nke onyeisiala binyekwere aka na ụbọchị 30 nke Disemba, mana akwọ nwa agbọghọ ga ụlọọgwụ mana ha enyeghi ya ọgwụgwo.

Ya bụru na ha nyere ya ọgwụgwọ, ọgaghị agba ọbara ma nwụọ. Anyị ga-ebido ijide ndị mmadụ maka udiri ihe a mere, makana ha agaghi akwụsị.

"Ka anyi binyere aka n'iwu a, onyeisi ala binye aka, ọ bụzị iwu.

Ndị omeiwu mechara jiri otu nkeji were kwanyere nwaada a ugwu.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ