WAEC Results 2018: Mmadụ 786,016 gafere ule afọ a

Nwantakịrị nọ n'ụlọakwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, 823, 424 ụmụnwoke na 748,972 ụmụnwaanyị dere ule a n'afọ 2018

Ụlọọrụ West African Examination Council (WAEC) ewpụtala mpụtara ule nke ndịukwu sekọndịrị afọ a bụ 2018.

Ulọọrụ ahụ kọwara na n'ime mmadụ otu nde na puku narị ise lere ule ahụ, mmadụ 786, 016 nke bụ pasentị 49.98 nwetara akwụkwọ ise ha gụnyere 'English na Mathematics'.

N'ime ndị gafere n'ule a, mmadụ 389,655 bụ ụmụnwoke ebe mmadụ 396,361 bụ ụmụnwaanyị nke bụ pasentị 47.32 bụ nwoke ebe pasentị 52.92 bụ ụmụnwaanyị. Nke gosiri na ụmụnwaanyị ka ụmụnwoke gafee ule ahụ n'afọ a.

Onyeisi ụlọọrụ ha Naịjirịa bụ Olu Adenipekun gwara ndị ntaakụkọ na ọnụọgụgụ ndị gafere ule a n'afọ a gbadara rue pasenti 10 ma i tulee ya na ndị gafere n'afọ 2017 ebe mmadụ 923,486 maọbụ (pasentị 59.22) gafere ya.

N'okwu ya; "N'ime mmadụ niile lere ule ahụ na Naịjirịa n'afọ a naanị mmadụ 1,470,338 ka anyị wepụtarala mpụtara ha ebe anyị ka na-eleba anya na nke mmadụ dị ọnụọgụgụ 102,058 maka ndehie dị icheiche ha mere oge ha na-edebanye aha.

"Waec na-emezi ndehie ndị ahụ ka anyị nwee ike iwepụta mpụtara ha."

Ndị niile dere ule ahụ na-ejighi Waec ụgwọ ọbụla nwere ike ịhụ mpụtara ha site n'ịga na webụsaịtị ha bụ www.waecdirect.org.

Onyeisi ha kwukwara na asambodo mpụtara ndị ha wepụtarala ga-adị iwere na mkpụrụ ụbọchị 90.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: