Onyeisi ndị uweojii azaghị oku Sineti

Ebe foto si, Nigeria Police/Facebook
Onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris,azaghị oku ulọomeiwu ukwu kpọrọ ya ụbọchị Wenesde kama ọ zigara osote onyeisi ndịuweojii bụ Josshak Habila.
N'okwu ya onyeisi Sineti bụ bukola Saraki kwuru na onwebeghi onye mere ụdị ihe a kemgbe ọchịchị onyekwuoucheya is lọghachị.
Ụlọomeiwu kpọrọ Idris oku na Wenesde, abalị 25 nke ọnwa Epreelụ ka ọ bịa zaa ha ajụjụ banyere nnwụchi ndị uweojii nwụchiri Sinetọ Dino Melaye na nsogbu oke ogbugbu mmadụ n'ala anyị mana ọ zaghị ha.
Onyeisi Sineti rịọrọ ndị otu ya ka ha nyekwa Idris amara otu izuụka nke bụ taa n'Elekere 11 nke ụtụtụ.
Mana ka ndị omeiwu mechara nzukọ nke ha mechiri oge ọ fọrọ obere oge ka ọ kụọ Elekere 12, ha ziri ozi ka a kpọbata Idris.
Mana her chere nkeji ole na ole , ha ahụghị ya.
Ibrahim, onyeisioche kọmitii nke okwu gbasara ndị uweojii kwuru na ya gbara mbọ inweta onyeisi ndị uweojii mana ya enwetanwughị ya.
Onye ọrụ ụlọmeiwu kwuru na ya degara Idirs akwụkwọ ozi ma gakwa rịọ ya ka ọ gba mbọ ụbọchị Tọsde mana o kwuru na o mechara chọpụta na kama ịza oku ha na ọ gara Kaduna njem.









