Ụlọomeiwu nta: Chụọ Ibrahim Idris n'ọrụ

Ebe foto si, Alamy
Ha sị na Idris enweghị ike ibelata ogbugbu ndị mmadụ na mpụ ndị ọzọ na-ari elu na Naịjirịa ugbua.
Ha kwukwara ka onyeisi ala tinye onye uwe ojii ọzọ ga-arụ ọrụ dịka o kwesịrị.
Mkpebi a ndị omeiwu mere sotere oku Nuhu Damburam bụ onye otu APC na-anọchite Kano, kpọrọ maka mkpa ọ dị ilebanya na mkpamkpa ndị agboro ndọrọndọrọ na-akpazi na Kano steeti.
O boro ebubo na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa anaghị eme ihe ọbụla doro anya maka ọgbaghara jupụtara na'Naijiria ya.
Cheta na izu ole na ole gara aga, Sineeti kpọrọ Ibrahim Idris oku ka ọ bia kọwara ha ihe mere ọ nwụchibeghị ndị na-achị ahụ wakporo Steeti Benue ma gbuo mmadụ iri asaa na atọ.





