Ndị dọkịta Naịjirịa na-agbaga mba Briten

Ebe foto si, Getty Images
Ọnụ ọgụgụ ndị dọkịta Naịjirịa na-arụ ọrụ na mba Briten na-arị elu n'ike n'ike, bụ ihe otu na-etinye anya na nchọpụta bụ Africa Check kwuru.
N'ime afọ gara aga, ndị dọkịta si Naịjirịa, afa ha dị n'akwụkwọ ndị dọkịta na UK General Medical Council na mba Briten agbala abụọ, ọrịrị ruru percenti 89.
"Na 2016, dọkịta 245 denyere aha na Briten. N'afọ gara aga, o rigoro ruo 439, bụ ihe bụlịlị ọnụ ọgụgụ ndị dọkịta ruo 5,060," Africa Check kwuru.
N'afọ a, dọkịta iri na abụọ si Naịjirịa na-edenye afa ha na Briten kwa izuụka -- bu ihe bulitele ọnụ ọgụgụ ha ruo 5,250 na Eprelụ 28, ndị nchọpụta kwuru.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mgbe ebụru ụzọ wepụte ọnu ọgụgu ndị dọkịta Naịjirịa na Briten, bu n'afọ 2006, ha dị afọ 2,692.
Amaghị ihe mere ndị dọkịta Naịjirịa jiri agbaga Briten, mana ọtanishi na-eme na Naịjirịa nakwa nkụsị ọrụ ndị dọkita mere n'afọ 2017 maka ụgbọ eji ha nwere ike soro me ya.

Akụkọ ga-amasị gị:





