Anwụchiela onyeisi mahadum Zimbabwe maka asambodo Mugabe

Ebe foto si, JEKESAI NJIKIZANA
A nwụchiela Levi Nyagura bụ onyeisi University of Zimbabwe maka inye nwunye onye isiala Zimbabwe ochie, Robert Mugabe, asambodu edoghị anya.
Ngalaba na-ebu agha megide mmerụaka anwụchiri Nyagura mana akpọbeghị ya ga ụlọikpe.
E nyere Grace Mugabe asambodo mahadum n'afọ 2014 ka ọ gụrụ akwụkwọ nanị ọnwa ọle na ole agbanyeghị a na eji ọtụtụ afọ enweta ya.
A gbasara edemede o dere ka ọtụtụ ndị mmadụ bidoro kpọwa oku ka anapụ ya nzere ahụ.
A mabeghị na-aga anwụchị Grace Mugabe.





