E zuru Nwankwo Kanu ohi nde dọlla iri n'otu na mba Rọshịa

Emume akpọrọ 'Ultimate Football Fans reality Tv Show' nke ndị Soccer Richweb haziri n'ọgbọ egwuregwu dị na Legọs.
Nkọwa foto, Emume akpọrọ 'Ultimate Football Fans reality Tv Show' nke ndị Soccer Richweb haziri n'ọgbọ egwuregwu dị na Legọs.

Ezuru onye ọgba bọọlụ ama ama bụ Kanu Nwankwo ohi ihe ruru nde dọlla iri n n'otu na ngwụcha izuụka gara aga na mba Rọshịa.

Ụlọ ntaakụkọ Moscow Times kwuru na ọ bụ ebe Kanu na-eme njem site na Moscow ruo Kaliningrad ka esi n'ime akpa ya zuru ego ahụ.

Akụkọ kwuru na ọ bụ mgbe Kanu ruru Kaliningrad ka ọ chọpụtara na-ezuru ya ohi.

Kanụ gara mba Rọshịa ị sonye n'asọmpị ndị dike n'ọgbaa bọọlụ ga-agba n'ụbọchị ụka ị ji kwado asọmpị iko mba ụwa na mba Rọshịa.

Minista na-ahụ maka ihe gbasara ime mba Rọshịa bụ Vladimir Kolokoltsev kwuputara na anwụchiela ndị ụlọọrụ ọdọ ụgboelu Moscow maka okwu a.

O si "mmadụ abụọ na-ebu ibu na ụgbọelu si London bata Moscow zuru ego n'akpa otu onye njem abaala nwuchi ebe a chọpụtara ha"

Kaliningrad bụ otu n'ime obodo iri n'otu a ga agba asọmpị iko mba ụwa n'ọnwa na Rọshịa.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị

Akara ntụ-ntụ