Akụkọ kachasi n'abalịa: Kanụ Nwankwọ agaghị azọ ọchịchị
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa.
Njem Orji Uzor Kalu na mpaghara ọdịda anyanwụ

Ebe foto si, Orji Uzor Kalu Facebook
Orji Uzo Kalu na Ọọnị nke Ife bụ Oba Adeyeye Enitan Ogunwusi, zukọrọ taa n'obieze ya.
Kalu mere njem a iji kwado udo n'etiti ndị Naịjirịa, o kwuru na o kwenyere n'ime ndịnotu Naịjirịa.
Njem a akpọgala ya n'obieze Alake nke Egbaland bụ Oba Adedotun Aremu Gbadebo nakwa Oba nke Lagos bụ Oba Rilwan Akiolu.
Mbugo n'ọkwa ndị agha Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Ndị agha Naịjirịa ebugoola ndịagha puku atọ na narị asaa na iri abụọ na itoolu (3,729) n'ọkwa.
Onyeisi na-ahụ maka mmekọrịta ndịagha na ndị mmadụ bụ Brigadier General Texas Chukwu, kwuru na ndị agha a ebugoro n'ọkwa bụ ndị otu Operashụn Lafiya Dole so lụọ agha operashụn Deep Punch nke abụọ n'ọhịa Sambisa.
Ikpe Jacob Zuma

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe amaala onye chịburu mba Saụt Afrịka bụ Jacob Zuma ikpe.
Ha mara ya ikpe maka mmerụaka n'ihe gbasara ngwaagha, mpụ na aghụghọ nakwa mbupu ego o mere n'ebe afọ 1990.
Cheta na Zuma rituru n'oche ọchịchị onyeisiala n'ọnwa Febụwarị ka ndị otu pati ya kwanyere ya ọkụ n'ike maka ebubo mmerụaka.
N'akụkọ egwuregwu

Onye gbabuuru Naịjirịa bọọlụ bụ Kanu Nwankwo, ekwuputala na ọ gaghị azọ ọchịchị na 2019.
O kwuru na ọ dịbeghị nkwadobe ịzọ ọchịchị n'oge na-adịghi anya dịka ọtụtụ ndị ntaakụkọ siri kwuo n'izu gara aga.
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji
Ihe nkiri taa











