Akụkọ kachasị n'abalị a: Mmadụ 25 anwụọla site na volukeno na Guatemala
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Akụkọ ndị dị mkpa n'abalị a:
Abụbọ ọrụ n'ụlọọrụ mịnịsịtrị sayensi na nka na ụzụ

Ndị ọrụ nọ na mịnịsịtrị sayensị na nka na ụzụ na ndị nkuzi na-arụ n'ụlọakwụkwọ na-eme nyocha awụsala ngwọ ọrụ ha n'abụbọ ọrụ.
Ha kwụsịrị ọrụ na mịnịstrị ahụ na-ekwu ka e wepụ ode akwụkwọ ụlọakwụkwọ ndị ahụ bụ Shamaki.
Naịjirịa
Ego ụtụ ibubata mmanya ọkụ na anwụrụ etinyekwuola

Ebe foto si, Getty Images
Ndị niile na-ebubata mmanya ọkụ na anwụrụ bido taa ga-amalite ịkwụ ụgwọ ụtụ e ji ebubata ngwọahịa nye gọọmenti etiti.
Gọọmenti etiti ga-amalite taa ịna ụgwọ ụtụ na ngwọahịa mmanya ọkụ na anwụrụ.
Akụkọ mba ofesi
Ọgbatauhie dakwasịrị mba Guatemala

Ebe foto si, Guatemala Government
Ajọ ihe mberede volukeno mere na Guatemala taa egbuola mmadị iri abụọ na ise.
Volukeno ahụ mere taa kachasị njọ na nke merela ebe ahụ kamgbe afọ otu narị.
N'egwuregwu,
E zuru Kanu Nwankwo ohi na Rọshịa taa ruru puku dọla iri na otu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Serena Williams esepụla aka n'asọmpi French Open tupu ọ ga-ezute Maria Sharapova
Ndị mmadụ mmadụ na-ajụ ka ọ bụ ụjọ mere Serena jiri sepụ aka mana akụkọ kwuru na Serena nwere mmerụ ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:











