Babachir Lawal: A chọrọ m ka EFCC nyocha ebubo eboro m

Ebe foto si, Channelstv
Onye bubụ odeakwụkwọ gọọmentị etiti bụ Babachir Lawal ekwuola na obi dị ya ụtọ na nyocha ndị EFCC na-eme n'ime ebubo eboro ya.
O kwuru nke a n'ajụjụ ọnụ pụrụiche ndị ntaakụkọ gbara ya.
N'okwu ya "Ọ na-amasị m, n'ezie ọ dịla anya m chọrọ ka EFCC bata n'okwu a, maka ha nwere ndị tozuruoke nakwa ngwaọrụ dị mma iji chọpụta nke bụ eziokwu."
Cheta na onyeisiala Mohammadu Buhari chuturu Lawal n'ọnwa Ọktoba, 2017 maka ebubo mpụ na nrụrụaka ego.
O kwuru na ebubo a agaghị emetụta mmekọrịta ya na onyeisiala, maka na a mabeghị ikpe.
"Ọ bụrụ na onyeisiala bụ nwanne m, ọ pụtara na ọ gaghị abụzị nwanne maka a na-eme m nyocha? Mmekọrịta na-agbasa n'ihi ebubo eboro onye aka ya dị ọcha."

Ebe foto si, EFCC
Ndị kọmịttee lebara anya na nyocha Babachir Lawal gụnyere osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo, ọkaikpe gọọmentị etiti nakwa onye ndụmaọdụ nchekwa gọọmentị etiti.
Ha zigara onyeisiala akụkwọ nchọpụta ha n'ọnwa Ọgọsụtụ afọ 2017 ebe achụrụ ya na ọnwa Ọktoba afọ 2017.
A chụrụ ya maka ebubo inye ọrụ ngo n'ụzọ na-ezighi ezi nke ego ya karịrị nde narị naịra abụọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:









