EFCC agbala Ihejirika ajụjụọnụ gbasara mmefụ njeri $2.1

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ kwuru na EFCC gbara Ihejirika onye duru ndị agha naijria afọ anọ n'oge ọchịchị nke Goodluck Jonathan,ajụjụonu ihe ruru elekere asaa ụnyaahụ.
Nke a na-abia ọnwa ole na ole onyeisiala bụ Muhammadu Buhari kwuru na Ihejirika na ndị ọzọ arụturụ aka n' ebubo imefu ego amapụtara maka igo ngwaagha iji lụso Boko-Haram ọgụ.
Dịka otu onye ọrụ EFCC akpọghị aha ya si kwa ụlọ ntaakụkọ Premium Times, "A jụrụ ya ajụjụ ihe gbasara igo ngwa agha mgbe ọ bụ onye isi ndị agha."
Wilson Uwujaren bụ ọnụ na-ekwuru EFCC asaghị ajụjụ ajụrụ ya gbasara okwu a.
Ihejirika kwuru na ya enweghị ọsịsa nye ajụjụ ndị ajụrụ ya, ma rịọ ndị na-agba ya ajụjụ ka ya rue ụlọ nwe ike iwepụta ọsisa ya n'uju.
Ndị nyocha na-eche na Ihejirika ji aha ndị ezinaụlọ ya na ndị ọzọ were nara ọrụngo igo ngwaagha nke ndị agha Naijriria.
E mechara hapụ ya ka ọ la ma gwa ya ka ọlaghachi taa bụ Thursday ụbọchị Nkwọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:






