EFCC agbala Ihejirika ajụjụọnụ gbasara mmefụ njeri $2.1

Azubuike ihejirika

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ihejirika ji enyeghị ha ọsịsa ajụjụoọnụ a jụrụ ya

Akụkọ kwuru na EFCC gbara Ihejirika onye duru ndị agha naijria afọ anọ n'oge ọchịchị nke Goodluck Jonathan,ajụjụonu ihe ruru elekere asaa ụnyaahụ.

Nke a na-abia ọnwa ole na ole onyeisiala bụ Muhammadu Buhari kwuru na Ihejirika na ndị ọzọ arụturụ aka n' ebubo imefu ego amapụtara maka igo ngwaagha iji lụso Boko-Haram ọgụ.

Dịka otu onye ọrụ EFCC akpọghị aha ya si kwa ụlọ ntaakụkọ Premium Times, "A jụrụ ya ajụjụ ihe gbasara igo ngwa agha mgbe ọ bụ onye isi ndị agha."

Wilson Uwujaren bụ ọnụ na-ekwuru EFCC asaghị ajụjụ ajụrụ ya gbasara okwu a.

Ihejirika kwuru na ya enweghị ọsịsa nye ajụjụ ndị ajụrụ ya, ma rịọ ndị na-agba ya ajụjụ ka ya rue ụlọ nwe ike iwepụta ọsisa ya n'uju.

Ndị nyocha na-eche na Ihejirika ji aha ndị ezinaụlọ ya na ndị ọzọ were nara ọrụngo igo ngwaagha nke ndị agha Naijriria.

E mechara hapụ ya ka ọ la ma gwa ya ka ọlaghachi taa bụ Thursday ụbọchị Nkwọ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ