Uru na ọghọm dị n'iwu ịkpachi ego nrụrụaka Buhari hiwere - Ọkaiwu

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ibuso nrụrụaka agha so na nkwa Muhammadu Buhari kwere na ọchịchị ya ga-arụ tupu ọ banye n'ọkwa onyeisiala

Ọkaiwu Chukwuemeka Eze kwuru na ọ dị mma ime iwu ịkpachi akụ ndị nọ n'ọkwa gọọmenti a na-ebo ebubo mmerụaka-nke a kpọrọ Executive Order on Corruption" mana ọ bụ ụlọomeiwu ka ọ dịrị ime nke a.

Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari binyere aka n'akwụkwọ ka gọọmenti nwee ikike ịkpachi akụ na ihe onwunwe ọrụ gọọmentị maọbụ onye nọ n'ọkwa ọchịchị a na-arụ aka imefu ego ala Naijiria ruo mgbe ikpe gbasara ya biri n'ụlọikpe.

Ọkaiwu Chukwuemeka Eze

Ebe foto si, Chukwuemeka Eze/Facebook

O kwuru na iwu ọhụrụ ga-anapụ ndị tinyere aka na mpụ akụ ha kpatara n'ụzọ akwụghị ọtọ, iji gbochie iji ya eduhie ndị na-eme nnyocha maọbụ ikpe.

Dịka Ọkaiwu Eze, onye bụ onyenkuzi mahadum na 'Nasarawa University,' siri kọwa, e nwere uru na ọghọm dị n'iwu ọhụrụ ahụ ma ọ bụrụ na gọọmenti jichi ego a na-arụaka na ọrịrị ego ọha tupu e bie ikpe ya.

Lee ụfọdụ ndị ọ gụpụtara:

Uru dị n'iwu ịkpachi ego nrụrụaka

1. Ka onye eboro ebubo nrụrụaka gbaa mbọ ka ekpe ikpe ya ngwangwa

2. Ọ ga-ewetu aka etu ndị mmadụ si ezu ego Naijiria

3. Ọ ga-ewelatara gọọmenti ego ha na-emefu ịchụgharị ndị a na-enyo enyo na ha buru ego ọha

Ọghọm dị na ya

1. Ndị mmadụ ga-agbagha ya n'ụloikpe si na o megidere iwu Naijiria

Ọkaiwu Eze kwuru na "ọ bụ ihe kwesiri ka ụlọomeiwu Naijiria (National Assembly) kwesiri ime iwu, ọ bụghị 'executive order."

2. Ọghọm ọzọ bụ na e nwere ike jichie akụ onye aka ya dị ọcha.