Buhari:Ndị ọkaiwu kwụsinụ mpu ma me ihe ziri ezi

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Buhari kwere ndị Naijirịa nkwa na ọchịchị ya ga-ekpochafụ mpụ na nrụrụaka.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ka otu n'ahụ maka ihe gbasara ndị ọkaiwu na otu ha sị akpa agwa akpọrọ National Judical council(NJC) wetechara ihe ha kpatara n'ọgbakọ ha,Buhari akwadola ila ezumike nka n'ike okaiwu ukwu akpọrọ Adeniyi Ademola nke ụlọikpe

ukwuu gọọmentị etiti (federal high court) di na Abuja ya na ichụ n'ọrụ okaiwu O.O Tokode nke ụlọikpe ukwuu dị na Benin.

Akwụkwọ ozi onye na-ekwuchitere ụlọọchịchị Naijiria bụ Garba Shehu wepụtara kwuru na ya bụ nkpebi nwere nkwado n'akwụkwọ iwu nke Naijiria dika esi hazigharia ya.

Ọkaiwu O.O. Tokode ga-akwụghachị ụgwọ ọnwa niile o nwetere n'ụzọ na-ezighi ezi site na ọnwa Disemba abụo n'afọ 2015 mgbe e duru ya n'iyi ọrụ dika ọkaiwu ukwuu nkje gọọmentị etiti rue ụgbụa.

Shehu sịrị na Buhari na-ayọị ndị ọkaiwu ka mee ihe ha kwesịrị ime ma gbanahụ mpụ na nrụruaka ma ha na-arụ ọru ọrụ ha.

N'ime akwụkwọ ozi ọzọ, Shehu siri na Buhari na-agba mbọ ihụ na onye ọbụla ndị NJC họpụtara maka iru na ụlọikpe dị iche iche ga-abụrịrị onye na-enweghị ntụpọ.

Lotanu na ndi NJC kpebiri na nzukọ ha mere n'ọnwa Disemba isii n'afọ 2017 ezumike nka n'ike nke Ademola na Tokode maka nrụrụaka.

Gụrụ ihe ndị mmadu na-ede n'igwe okwu twita:

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2