Ipob: Kpọpụtanụ Nnamdi Kanu - Ọkaiwu ya

Ebe foto si, Getty Images
Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu onyeisi ndị otu Ipob na-efu efu bụ Nnamdi Kanu akpọkuola ndị agha Naịjirịa ka ha kpọpụa Kanu ebe ha ji ya.
Oku a na-abịa ka o mere otu afọ Kanu furu ka ndị agha Naịjirịa wakposiri ụlọ ya dị n'Afaraukwu n'Abia steeti ụbọchị Sepụemba 14, 2017.
N'akwụkwọ Ejiofor dere, o kwuru na Kanu kpọrọ ya n'abalị ụbọchị ahụ ndị agha wakporo be ya ma kpọkwa oku ka otu mbaụea dị icheiche lebaa anya n'okwu ahụ ma hụ na a kpọpụara Maazi Kanu ma mee nyocha banyere arụ megide mmadụ.
Cheta na ndị agha Naịjirịa kporo ndịagha gaa mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa n'ọnwa Sepụemba afọ 2017, n'agha ha kpọrọ 'Egwu Eke', iji kwụsị ndị otu Ipob na-eme ngaghrị iwe ka e kewaa Naịjirịa.
N'oge agha ahụ, ndị agha wakporo ụlọ Nnamdi kanu bụ onye e nyeburu nwereonwe site na 'bail' ebe a na-ekpebu ya ikpe maka arụ megiere ala.
Mana ọkwaikpe Binata Nyakobụ onye na-ekpe ikpe Kanu kpere ikpe n'ọnwa Jenuwarị afọ a na o nweghi ihe na-egosi na ndị agha Naịjirịa ji Nnamdi kanu.
Agbanyeghi ikpe ahụ n'akwụkwọ ozi ahụ Ejioforo wepụtara iji cheta ndị nwụrụ oge mwakpo ndị agha ahụ, Ejiofor kwuru na nkata ikpeazụ ya na Kanu kpara bụ oge ndị agha ahụ nọ n'ụlọ ya.
N'okwu, Kanu gwara ya "Ejiofor, e gbojibidoro ụlọ m, ndị agha na-abata n'ike, na-agba egbe n'ihe niile ha na-ahụ, ị na-anụ olu egbe ahụ, biko gwaa ndị ụwa maka ihe a mere n'ụlọ m.
"Ana m ahụ site n'ime ụlọ na ha agbatuola ọtụtụ ndị otu m nọ n'ala dịka ha na-abata n'ime ụlọ m, ndụ m enweghizi nchekwa, gwa gọọmenti Briten na nke ndị Amerịka na ụwa niile na ọ bụ gọọmenti Naịjirịa ka a ga-ejide ma ihe ọbụla mee m."
Site na nkata a, Ejiofor na-agbadosi ụkwụ ike na ọ bụ gọọmenti Naịjirịa ji Kanu mana gọọmenti Naịjirịa ugboro ugboro ekwuola na ha ejighi ya.
Ejiofor kpọrọ ka ụwa niile tinye ọnụ n'okwu a dịka a na-eme ncheta maka ndị nwụrụ n'oge ahụ.











