Ipob si ka aga n'iru enye mkpebị ruru Nnamdi Kanu

Ebe foto si, AFP
Ndị na-azọ ikewa Naijirịa iji nweta mba ha ga akpọ Bịafra bụ Ipob kwuru na ụlọịkpe Naịjiria ebe a na-ekpe ịkpe onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu kwesiri ime ọsọ ọsọ kpebie okwu gbasara ya.
Ha kwuru na ụlọikpe kwesiri ị ga-ihụ n'ikpe ahụ n'agbanyeghi na akwụkwọ ịkpe ya furu efu.
Onyeisi nhazi na Ipob bụ Mazi Chika Edoziem kwuru na ihe ọ bụla ga-egbu oge n'inye ikpe a bụ mgbochi ikpe ziri ezi.
Ipob kwuru na onwebeghị na ndụ Naịjiria ebe akọrọ akụkọ n'akwụkwọ ikpe ha ka nke a furu efu n'ụbọchị ekwesiri ịnye mkpebi ya.

- Ụbọchị Maachị 8 n'afọ 2017 ka enyere ịkpe nke ndị IPOB na-achọ ịtugharị ugbua (Appeal Case No CA/A/78A/C/2018)
- Justice John Tsoho bụ onye nyere ikpe a n'ụlọikpe Naịjiria
- Ebugharịrị okwu ikpe ahụ bugara ya Justice Binta Nyako
- Ụnya ahụ bụ Ferburuwarị 13 ka ụlọịkpe Naịjịrịa nyere a ga-eji nye mkpebi maka okwu ịkpe a.

Ajụjụ Edoziem na-ajụ bụ: "Kedụ ebe akwụkwọ ikpe Nnamdị Kanụ dị?"
Ọ sị na ọ bụrụ eziokwu na akwụkwọ ahụ furu efu na ndị ọkaịkpe ukwu kwesiri inwe nke ha a ga-eji maatụ.
"Nke a egosiri na ụlọikpe ndị Naịjiria enweghị ike ịchekwa ihe ndekọ na mkpebi ha nyere n'oge gara aga?" bụ ihe Edozem na-ajụ.
Ọ jụkwara si, "Ọ pụtara na ndị ọkaikpe ukwu Naịjiria anaghị eso ihe iwu kwuru?"
Ọ sị na omume nke a n'esgosi na onwere ndị na-agba izu ọjọọ n'imegide ịkpe ziri ezị ekwesiri ịnye Kanụ.

Ebe foto si, Getty Images
Anyị na-agba mbọ ị nweta okwu ndị ọkaịkpe ukwu maka akụkọ a, dịka ọ sị-aga, akụkọ ka na-abịa.









