Kemi Adeosun: Ihe mere m ji tinye akwụkwọ arụkwaghịm

Kemi Adeosun

Ebe foto si, @HMkemiAdeosun

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Adeosun kwuru nke a n'akwụkwọ ozi arụkwaghịm o degaara onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari.

Ụnyaahụ bụ Frịade, Adeosun tinyere akwụkwọ arụkwaghịm nke onyeisiala kwukwara n'otu ụbọchị ahụ na ya anabatala ya.

Ọ kọwara sị: "A hụrụ m taa nyocha e mere banyere ebubo iji asambodo adigboroja NYSC na-arụ ọrụ nke otu ụlọ ntaakụkọ nọ n'ịntanet boro m.

Ọ bụ ihe ịtụnanya ịchọpụta na asambodo NYSC m wetara abụghị ezigbo ya. Ya mere m ji gbado ụkwụ n'ịkwụwa aka ọtọ nke ọchịchị a were na-asị ka m kwanyere onwe m ugwu rituo n'ọkwa."

Ọ gara n'ịhụ kọọ akụkọ etu nne na nna ya siri mụọ ya na mba Briten ebe ọ nọrọ too.

Kemi Adeosun na ndị mịnịsta ndị ọzọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, E duru Kemi Adeosun iyi ọrụ dịka Mịnịsta na-ahụ maka ego n'afọ 2015

Kọọwa na ọbịbịa ya n'ala Naịjịrịa na-abụkarị oge ezumike were rute mgbe ọ gbachara afọ 34.

Ọ bụ oge ahụ ka ọ natara akwụkwọ ikike mbụ ya dịka onye Naijiria.

O kwuru na ọ bụ ka ọ lọtara Naijiria ka okwu iwu iji otu afọ fee ala Naijiria iji ya malitere.

"A gwara m na agafeela m afọ 30 maka ife ala nna. Ọ bụ ndị nọ m nso nyere m aka ị ga NYSC hụ na m nwetara akwọkwọ na-egosi na a gafeelam afọ ole e ji efe ala Naijiria.

"Dịka m arụbeghị na NYSC maọbụ ga n'ụlọọrụ ha, ọ tụghị m n'uche na asambodo ahụ abụghị nke ezigbo ya.

"N'ezie, ọ bụ asambodo ahụ ka m nyere ndị ụlọomeiwu Ogun steeti n'afọ 211 nakwa DSS na Ụlọomeiwu etiti n'afọ 2015."

Cheta na kemgbe ọnwa Julaị oge ụlọọrụ akụkọ Premium Times gbara ya n'anwụ, ebubo ịkpụ asambodo NYSC adịgboroja dọrọ ya bụ nwaanyị rụburu ọrụ dịka Kọmishọna na-ahụ maka ego n'Ogun steeti na ọchịchị Buhari n'olu ka ibu anyịdanda.

Ọtụtụ kpọrọ Buhari oku ka ọ chụọ ya n'ọrụ ma kpụpụ ya ụlọikpe.

Ka ọ dị ugbua, ụfọdụ ndị dịka Reno Omokri a gbagharala ya dịka ọ rituru n'ọkwa.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Mana ụfọdụ dịka Adụllaziz Bakare ka na-akpọ oku ka a ọ ga ụlọikpe ga zara ọnụ ya.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ