Anwụchiela nwaanyị na-atụ mgbere ụmụagbọghọ
A mara otu nwaanyị onye nọọsụ ikpe na mba Briten maka ịtụ mgbere ụmụagbọghọ.
A mara Josephine Iyamu ikpe maka ịkpọbụ ụmụagbọghọ Naịjrịa mba Jamịnị ị ga rụọ ọrụ dịka ndị akwụna.
N'akụkọ nke pụtara n'ihe ọnyonyo, onye ntaakụkọ BBC bụ Fiona Bruce zutere otu n'ime ndị Iyamụ tụrụ mgbere.
Iyamu bụ onye mbụ a ga-ama ikpe site n'iwu a ehiwere ọhụrụ na-etinye anya n'ịtụ mgbere mmadụ.
Iyamu si Edo steeti na Naịjirịa ree umụnwaanyị na Jamani, ebe akwanyere na-ire onwe ha.

Ebe foto si, AFP
Nwaanyị a mere ka ndị ṅụọ iyi na ha ga-enye ya ihe niile ha rụtara na-akwụna.
Otu nwaanyị ihe a metụtara kwuru na ego oji Iyamu maka orure ya na Jamịnị ruru nde naịra iri na ise.
A ga-ekwu ihe a ga-eme Iyamu n'ụbọchị anọ nke ọnwa jụlaị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:












