N800b subsidy: Gọọmentị ọ ga-akwụli ya n'ime ụbọchị asaa?

Ebe foto si, Getty Images
Odee akwụkwọ otu akpọrọ "Major Oil Marketers Association of Nigeria MOMAN" bụ Clement Isong agwaala BBC na-onweghị mgbe ha nyere gọọmenti iwu na ha ga-agba abụbọ ọrụ.
O kwuru na naani mkparịtaụka bụ ihe ha ji agwa gọọmenti etiti na ha kwụọ ha ụgwọ.
N'ọnụ ya, "Ndị nọ ọchịchị ugbua natara ụgwọ ha ji anya n'aka ndị nọbụ n'ọchịchị, ha kwụrụ ya bụ ego enyemaka gọọmenti mana ha akwụghị ọmụrụ nwa di n'elu ya."
Mana odee akwụkwọ Independent Petroleum Marketers Association bụ Danladi Pasali gwakwara BBC na ha ekwughi na ha ga-agba abụbọ ọrụ kama na ha kwụ ebe ndị otu ndị ọzọ na-azụ ahịa mmanụ
ụgbọala kwụ bụ ka akwụọ ha ụgwọ ha.
"Otu anyị enweghị ikike igba abụbọ ọrụ. Anyị bụ ndị ji ego achụ ego na ngalaba ọrịre na ọzụzụ mmanụ agbịdị mana gọọmentị ji anyị ụgwọ."
"Anyị na ndị ụlọọrụ Debth Management Office DMO na-enwe mkparịtaụka ka e wee kwụọ anyị ụgwọ."
Pascali kwetekwara na ego ahụ ruru ijeri narị naira asatọ nakwa ụlọomeiwu ekwuola ka akwụọ ha ụgwọ a ebe gọọmenti na-agba mbọ ikwu ha ụgwọ a.
Cheta na akụkọ pụtara na mbụ kwuru ndị na-azụ ahịa mmanụ ụgbọala na Naịjirịa enyela gọọmeentị etiti ụbọchị asaa ka ha kwụọ ha ego ruru Ijeri naira narị asatọ (N800b) maka ego enyeamaka mmanụ ụgbọala gọọmentị na-enye.
Ha kwuru na ọ bụrụ na akwụghị ha ego ma ụbọchị asaa gafechaa, na ha ga-agba abụbọ ọrụ.
Ha kukwara na ha ga-akwụsị orire na ọzụzụ mmanụ n'ọdọ mmanụ ụgbọala n'akụkụ obodo Naịjirịa di iche iche maọbụrụ na akwụghị ha ego n'aka.
"Major Oil Marketers Association of Nigeria,(MOMAN)," "Depot na Petroleum Products Marketers Association (DAPMA)" nakwa "Independent Petroleum Products Importers (IPPIs)" kwuru na ha ga-eme ka ndị ọrụ kwụsị ọrụ n'ike maọbụrụ na ha enweteghị ego a ma ụbọchị asaa gafechaa.
Akụkọ kwuru na ụlọakụ ewegharala akụ na ụba nakwa ego ha ji azụ ahịa nke bụ na enweghị nke ha ga-eji kwụ ụgwọ ha ji.

Ebe foto si, Getty Images
Ha kwuru na ọ bụ naani gọọmenti ga-enyere ha aka maọbụrụ na ha kwụọ ha ụgwọ a.
Onye ọkaiwu IPPI bụ Patrick Etimkwuru na kamgbe ọchịchị Buhari bidoro, na ha na gọọmenti enweela ọgbakọ ka ha wee kweta na ha ga-akwụ ụgwọ enyemaka nke pụtaranụ mgbe ndị ọchịchị Naịjiịa garaaga na-achị.
Ha kwuru na ọ bụ eziokwu na ha akwụtụla ya bụ ego mana ego enyemaka si n'aka gọọmenti ha ka ga-akwụ akwụ ka hiri nne.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:









