World AIDS day: Ọrịa HIV na AIDS ọ bụ otu ihe?

Dọkịta na-enyocha mmadụ ahụ

Ebe foto si, Getty Images

Ụfọdụ ndị na-ajụ ma enwere ihe dị iche n'etiti ọrịa akpọrọ 'AIDS', na nje HIV?

BBC jụrụ Dọkịta Anthony Mgbolu, ihe dị iche n'etiti ọrịa abụọ a, ọ kọwara na ọ bụ HIV na-emecha bụrụ AIDS.

Mgbolu kwukwara na mmadụ nwereike inwe HIV ghara inwe AIDS, ọkachasị ma a chọpụta ya n'oge.

O kwukwara na ndị mmadụ na-ebizi ogologo ndụ na-enweteghịzị AIDS, mana ọ bụrụ na ị nwere AIDS, ya bụ na ị nwere HIV.

Gịnị bụ HIV?

Ịkpọru ya n'isi, HIV pụtara (Human Immunodeficiency Virus).

Nje HIV bụ nke na-amụbanye ma bụrụ AIDS ma ọ bụrụ na achọtaghị ya n'ahụ mmadụ ọsịsọ.

HIV a na-ebidoghi n'oge gwọwa na-akutucha ihe ndị na-echekwa ime ahụ mmadụ nke Bekee kpọrọ "immune system".

Dọkịta Mgbolu kwuru sị "Ọ bụ oge "immune system" onye bu HIV dachara mba ka ọ na-abanyezi ọrịa AIDS."

Gịnị bụ AIDS?

Ịkpọru aha ya n'isi, AIDS pụtara (Acquired Immune Deficiency Syndrome).

Ọrịa a bụ otu n'ime ọrịa ụwa na-atụbu ụjọ maka etu o si egbu mmadụ, ebe ọ na-abụ o jide gị ọ mịkpọọ gị maọbụrụ na a chọpụtaghị ya n'oge.

Mana ugbua, achọpụtala etu onye nwere ya ga-esi bie ogologo ndụ nakwa n'ezigbo ahụike.

Etu e si ama onye bu nje HIV na AIDS

A na-ama onye bu ọrịa a site n'inyocha ọbara ya ịchọ ma a ga-ahụ ihe na-aluso nje HIV ọgụ nke Bekee kpọrọ "HIV antibodies".

N'otu aka ahụ, e nwereike inyochapụta AIDS n'ahụ mmadụ, site n'inyocha ihe Dọkịta Mgbolu kpọrọ "viral load", ịgụ mkpụrụndụ a kpọrọ "CD4 cells" ọnụ, nakwa inyocha etu o si ewu onye ahụ n'ahụ.

Nyocha HIV dị mfe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, E meela ka usoro nyocha HIV na AIDS dị mfe

Onye nwere nje HIV?

Onye nwere nje HIV nwereike ị na-egosipụta ihe ndị a:

  • Oke ike ọgwụgwụ
  • Ịga mposi kwamgbe na ịgbọ agbọọ
  • Ụkwara na-anaghị ekwe ala ala
  • Ha ga-ebido ịta ahụ

Onye nwere AIDS?

Tupu ị nwee AIDS, ya bụ na ị nweela HIV.

  • Onye nwere AIDS ga-amịkpọcha amịkpọ dịka ihe gwụrụ agwụ.
  • Ihe Bekee kpọrọ "oral thrush" ga-agbakasị ya n'ọnụ
  • O nwere ike inwe ọrịa ụkwara nta Bekee kpọrọ "Tuberculosis"
  • Ọ na-enwekwa ọrịa obi dị iche iche
  • Iri nri agaghị agụ ha ọfụma
  • Ha ga na-aga mposi kwam kwam na ịgbọ agbọọ
  • Ọbara dị ha n'ahụ ga-agbada ọfụma

Etu e si ebute HIV na AIDS

  • E nwereike ibute nje HIV a site na mmekọrịta nwoke na nwaanyị maọbụ mmekọrịta nwoke na nwoke nakwa nwaanyị na nwaanyị.
  • E nwereike ibute nje a site n'iji ihe onye bu ọrịa a ji akpụ isi, akpụ nke gị.
  • E nwereike ibute nje a site n'ịmetụ ihe dị nkọ dịka ndụdụ, mma nakwa rezọ onye nwere ọrịa ndị a, na-eji eme ihe, aka. Nke a bụ maka na ọrịa na-esi n'ọbara efe mmadụ.

Mgbochi HIV na AIDS

Ndị dọkịnta nwere ihe ha na-akpọ ABC - nke pụtara

  • A - 'Abstinence': Nke a bụ mmadụ ịghara inwe mmekọahụ
  • B - "Be faithful": Nke a bụ mmadụ inwe naanị otu onye ya na ya na-enwe mmekọahụ (ọ gaghị na-akwaso onye ọbụla ọ hụrụ iko aghara aghara)
  • C - "Condom": Nke a bụ ikpunye okpunnabụenyi tupu ị nwee mmekọahụ. Nke a ga-eme ka mmiri ahụ gị na nke onye gị na ya nwere mmekọahụ ghara ịmetụ.

Ụzọ ọzọ bụ, ekọkọrịtala ndụdụ maọbụ mma na ihe dị nkọ.

Ọ bụrụ na i nwere ọrịa HIV, echefula ịnwụ ogwụ gị nke Bekee kpọrọ "Anti Retroviral drugs" (ARV).

Esere ese etu e si eyi okpunnabụenyi

Ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa HIV na gburugburu mbaụwa n'afọ 2017 gbalitere:

Ndị butere HIV n'afọ 2017

N'ime afọ isii gara aga, ndị bu ọrịa HIV na-arịgo kama ịgbada agbada.

Nke a mere na ebe mmadụ ruru nde 33 bu ọrịa a n'afọ 2012, mmadụ ruru nde 36 buzi ya n'afọ 2017.

Mana ndị butere ọrịa HIV ọhụrụ n'ime afọ ahụ gbadara site na nde 2.1 ọ nọbu, daruo nde 1.8 n'afọ 2017.

Ọnụọgụgụ ndị bu HIV
Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ