Eha-Amufu: Hapụ ndị nduhie, Enugwu steeti kachasị nwee nchekwa na Naịjiria - Gọvanọ Mbah

Gọvanọ Peter Mbah

Ebe foto si, Enugu Govt

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Gọvanọ Peter Mbah ekwuola na Enugwu steeti bụ steeti kachasí nwee nchekwa na Naịjiria na-agbanyeghị ihe ndị ọ kpọrọ "ndị nduhie" na-ekwu.

O kwuru nke a mgbe ọ nabatara AIG Abayomi Oladipo, onyeisi nke ndị uwe ojii na-ahụ maka mpaghara 13 na Enugwu n'ụbọchị Wenezde Junn 18, 2025

Nke a na-eme dịka ndị uwe ojii nwụchịrị ndị mmadụ na ogbugbu egburu n'Eha-Amufu.

Ka ọ dị ugbu a, ndị uwe ojii nọ n'isi-Uzo nwụchịrị mmadụ abụọ a na-ebo ebubo na ha na-arụkọ nakwa na-enye akụkọ ozi nye ndị bịara mee mwakpo ahụ ma resịkwa ndị na-achị ehi ozi gbasara njem ndị nchekwa.

Ọ dịzi ka gọọmentị ọgbahapụrụ anyị ka a na-egbusi anyị n'Eha-Amufu - Ndị obodo ebeela akwa

Ndị obodo Eha-Amufu gbakọtara n'obodo mgbe a na-ebupu ozi mmadụ e gburu egbu.

Ebe foto si, Screenshot

Obodo Eha-Amufu di n'okpuruọchịchị Isiuzo nke Enugwu Steeti nọ n'iru uju ugbua n'ihi mwakpo ndị a sị bụ ndị ọchịehi wakporo ha ma gbuo ihe ruru mmadụ iri na otu.

Nke a mere n'ụbọchị Mọnde 16 Juun, 2025 mgbe ndị obodo nọ n'ehi ụra ka ndị a bịara wakpoo dịka ha si emebu ha n'otụtụ ugboro gara aga.

Ọtụtụ ndị obodo gbakọtara na mbara ama ha dịka ha na-ebe akwa na-eme ngagharịiwe ka a na-ebupụta ozi ndị e gburu na mwakpo ahụ.

Otu onye obodo ahụ bụ Ifeanyi Ogenyi kọọrọ BBC Igbo etu ihe a si mee, ọ kwara arịrị kwuo na "ndị ọchị ehi a hapụzịrị ime ọhịa ebe ha na-achi ehi na-abatazi n'ime obodo egbu ndị mmadụ."

Obodo Eha-Amufu ebe e gburu mmadụ ruru iri na otu n'ụbọchị Mọnde 16 Juun, 2025.

Ebe foto si, Screenshot

Ogenyi kọwara na ọ dịzị ka gọọmenti echefuru ndị obodo ha makana o nwebeghị ka gọọmenti si kwụsị ndị a ịna-awakpo ha.

O kwuru na ha enweghi ngwa ọgụ maọbụ egbe iji echekwa onwe ha.

"Naani ndị nche ọdịnala agaghị emenwu ihe dị na ya, Gọmenti kwesiri izitere anyi ndị nchekwa siri ike nwere ike ijide ndị ọchiehi ahụ.

" N'izuụka gara aga, ha gbukwara ọtụtụ mmadụ n'obodo Mgbuji, o ruo n'izuụka a ha gbuo mmadụ iri na otu n'obodo Aguamaede"

"Ike ibe akwa agwụla anyị n'Eha-Amufu. O nweghizi onye egwu kwere gaa ọrụ ugbo bụ ihe e jiri maara anyị bụ ndị Isi-Uzo."

Ụfọdụ ndị obodo kwuru na ha hụrụ ka ụgbọelu helikọpta na-efegharị n'abalị ahụ ma tụdata ndị a bịara wakpoo ha ebe ndị ọzọ kwuru na ha ahụghị ụgbọelu ọbụla.

Mana BBC Igbo enweghi ike ịkọwa ma nke a ọ bụ eziokwu maọbụ a sị ugbua.

Mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ ndị uweojii Enugwu Steeti banyere ogbugbu ndị mmadụ n'Eha-Amfu, ha azaghị ekwe ntị maọbụ ozi e zigaara ha tupu akụkọ apụta.

Ogbugbu ndị Eha-Amufu a kwụsị - Peter Obi

Peter Obi bụbu Gọvanọ Anambra Steeti ma bụrụkwa onye ji aha Labour Pati zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023.

Ebe foto si, Peter Obi/X

Peter Obi ji aha Labour Pati zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 katọrọ ogbugbu ndị mmadụ n'obodo Eha-Amufu.

O tiri ezinaụlọ ndị o metụtara aka n'obi site n'ozi o wepụtara n'akara soshal midia X.

"O teela aka e bidoro na-awakpo obodo Eha-Amufu, ụdịrị mwakpo a kwesịrị ịkwụsị ka ndị obodo nwee udo.

"Anyị agaghị anọ na-ekiri ka a na-egbusi ndị na-akọ ugbo, nke mere na ụjọ na-atụzi ha ịbanye n'ọrụ gaa kọọ ugbo ha."

"Anyị agaghị anọ na-ekiri ka ọnọdụ nchekwa na-akawanye njọ," ka Obi kwuru.

Kedụ ihe gọọmentị Enugwu Steeti na-eme banyere nke a?

Gọvanọ Peter Mbah nke Enugwu Steeti

Ebe foto si, Peter Ndubuisi Mbah/Facebook

Gọọmentị Enugwu steeti ekwubeghi kpọmkwem ihe ọbụla banyere akụkọ mwakpo a mere n'Eha-Amufu n'ụbọchị Mọnde.

Mana otu onye ọrụ gọọmentị gwara BBC Igbo na a nwụchiela ụfọdụ ndị kpara arụ a nakwa ndị obodo na-enyere ha aka.

O kwuru na gọọmentị nọ n'isi ihe banyere nke a iji weta udo n'obodo n'Enugwu Steeti.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị uweojii ga-ewepụta ozi banyere nwuchi a n'uju.

Ụfọdụ mgbe a wakporola Eha-Amufu n'oge gara aga

Mgbe ndị ụweojii gara njem nleta n'obodo Eha-Amufu site na mwakpo mere n'ọnwa Nọvemba afọ 2022.

Ebe foto si, Enugu State Police

Nke a abụghị mbụ maọbụ abụọ ndị a na-eche na ha bụ ndị ọchịehi na-awakpo obodo Eha-Amufu dị n'okpuruọchịchị Isiuzo nke Enugwu Steeti.

Ụfọdụ obodo ndị a na-awakpo kaarị Mgbuji, Aguamaede, Okpokwu, Ogboete, Afo Isiala, Amaeze na ebe ndị ọzọ. Mwakpo ndị a na-akụkaarị kwa izuụka maọbụ kwa otu ọnwa dịka ndị obodo si kwuo.

N'ọnwa Mee nke afọ 2022, ka ndị e cheere bụ ndị ọchịehi gburu otu nwokoroọbịa a kpọrọ Ejike Odo ma merụọ nwanne nwoke ahụ, mgbe ha gara ịzọpụta nwanne ha nwaanyị ndị ahụ chọrọ ịwakpo n'ọhịa ebe ọ gara ugbo.

N'ọnwa Nọvemba, afọ 2022, awakporo obodo Aguamaede ma gbuo ọtụtụ ndị mmadụ ọkachasị ụmụnwoke mgbe ha na-enwe ọgbakọ ụmụnna.

Ụmụnwaanyị obodo Mgbuji, Abo na Aguamaede karịrị narị ise mere ngagharịiwe n'ụbọchị Mọnde, 5 Maachị, 2025 maka mwakpo ndị ọchịehi na-awakpo obodo ha.