Ihe mere mgbe ndị obodo Eha Amufu zutere Gọvanọ Ugwuanyi n'ime abalị

Ndị nchekwa na Gọvanọ Ugwuanyi

Ebe foto si, Enugu State Government House

Nkọwa foto, Gọvanọ Umahi na ndị nchekwa mgbe ọ gara njem nleta n'Eha Amufu

Gọvanọ Enugwu Steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi agaala njem nleta n'obodo Eha Amufu iji mata nke bụ eziokwu maka ihe na-eme n'obodo Aguamaede na Mgbuji nke dị n'ime Eha Amufu.

Gọvan Ifeanyi Ugwuanyi

Ebe foto si, Enugu State Government

NDị obodo Eha amufu

Ebe foto si, Enugu State Government

Nkọwa foto, Ndị obodo pụtara ka ha na Gọvanọ nwee mkparịtaụka

Ọ bụ ya na kọmịshọna ndị uweojii nke Enugwu Steeti bụ Ahmed Ammani, ọchịagha nke 82 Division bụ M.K Ibrahim na Bịshọp nke Nike Diocese bụ Christian Onyeka Onyia soro gaa ya bụ njem.

Gọvanọ Ugwuanyi garuru ọhịa, ahia , Mbara obodo ahụ na-ebe ndị ọzọ iji mara etu mmiri siri banye n'opi ụgbọọrọ.

Gọvanọ Dave Umahi na ndị obodo Eha Amufu

Ebe foto si, Enugu State Government

Nkọwa foto, Ndị obodo ji ohere kọọrọ gọvanọ Ugwuanyi ihe ha gabigara

Ugwuanyi ji ohere a nwee mkparịtaụka ya na ndị obodo a, tie ha aka n'obi ma kasịe ha obi ma kwuo na ọchịchị ya ga-ahụ na ha nwere ezi nchekwa ma hụ kwa na ha nwetere udo n'etiti ndị ọchịehi na ndị na-akọ ubi na mpaghara ahụ.

Ndị obodo Eha Amufu

Ebe foto si, Enugu State Government House

Nkọwa foto, Ndị obodo pụtara ka ha na Gọvanọ nwee mkparịtaụka

Ndị obodo kelere Gọvanọ Ugwuanyi onye ji abalaị bịa dịka ozugbo o si njem ya lọta ka ọ bịwara ebe ahụ.

Ha kwukwara na ọ bụ Ugwuanyi bụ Gọvanọ mbụ bịara leta ha kamgbe ha na ndị ọchịehi bidoro ịnwe nsogbu ma kelee kwa ya maka enyemaka ọ nyere ndị ọdachị a metụtara nke gụnyere nde naịra iri.

Ndị nchekwa so Gọvanọ Enugu Steeti

Ebe foto si, Enugu State Government

Nkọwa foto, Gọvanọ Ugwuanyi ji abalị mee ya bụ njem

"Ndị obodo anyị bụ Eha-Amufu, Enugwu ka na-agba ọsọ kamgbe abalị atọ"

Obodo ebe a sị ndị ọchịehi wakporo

Ebe foto si, Enugwu Police

Otu onye obodo Eka-Amufu ma bụrụkwa otu n’ime ndu obodo Mgbuji akọwaala ihe ndị obodo ha ga-abigara n’aka ndị e chere bụ ndị ọchịehi.

O kwuru na ọ dịla anya ndị ọchịehi malitere ịwakpo obodo ha mana nke mere na nso nso a malitere kamgbe ụbọchị anọ gara aga.

N’okwu ya “ndị a chụpụrụ anyị n’okeala anyị na ndị Benue steeti n’oge gara aga mana ugbua ha achụrụkwa anyị bịawa ebe anyị nọ ugbua ma gbuo ọtụtụ n’ime anyị”

“Kamgbe abalị atọ ka ndị obodo anyị nọ n’ọsọ ma rute ugbua, ụfọdụ ha gbagachara n’obodo ndị nọ anyị n’akụkụ.

Ọ gara n’ihu kwuo na gọọmentị emebeghi ezi ihe gbapụtara ihe banyere ọnọdụ ha, na ndị agha mkpụrụ ole na ole bu ụgbọala aha kpagharịa n’obodo ha n’ụbọchị gara aga.

O kwuru na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa nke obodo hiwere a kpọrọ ‘neighborhood watch’ ka bụ ndị na-enye aka echekwa obodo.

O kwuru na ebe mwakpo ndị a metụtara gụnyere Okpokwu, Ogboete, Mgbuji, Afo Isiala, Amaeze nke dịcha n’Eha-Amufu.

“Ndị tọọrọ ọtụtụ ndị obodo anyị, dịka anyị na-ekwu ugbua mmadụ atọ ha tọọrọ ka nọ n’aka ha.”

Ọ gara n’ihu kpọkuo gọọmentị Enugwu Steetị ka a gbatara aha ọsọ enyemaka ma chekwaa ndụ na akụnaụba ndị obodo ha.

Ndị uweojii sị na ọ bụ mmadụ itoolu ka ndị ojiegbe gburu n'Eha Amufu

Ndị uweojii gara n'obodo Eha-Amufu

Ebe foto si, Enugu Police

Ndị ọrụ nchekwa, gụnyere ndị uweojii, ndị agha ngalaba 82 Division, na ndị ọrụ DSS n'Enugwu steeti agaala n'obodo Eha-Amufu dị n'okpuru ọchịchị Isi-Uzo ebe ndị ekperima wakporo ma gbuo ọtụtụ mmadụ n'ụbọchị Mọnde, Nọvemba 21, 2022.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu bụ Daniel Ndukwe kwuru na ha gara ka ha jiri anya ha hụrụ ma were ntị ha nụrụ kpọmkwem etu ya bụ mwakpo si mee.

O kwuru na ọ bụ mmadụ itoolu ka e gburu na mwakpo ahụ, ma kwukwaa na amatabeghị kpọmkwem ndị bịara wakpoo obodo Eha-Amufu.

Mana ndị obodo ahụ gwara BBC Igbo na ọ bụ ndị ọchịehi wakporo ha.

Ndị uweojii gara n'obodo Eha-Amufu

Ebe foto si, Enugu Police

Ndukwe gara n'ihu kwuo na onyeisi ndị uweojii enyela iwu ka a malite nnyocha miri emi maka ihe a merenụ, ma kwe nkwa na onye ọbụla aka ya dị na ya ga-enweta ntaramahụhụ kwesịrị ya.

Nke a abụghị nke mbụ ụdị mwakpo a na-eme n'obodo dị icheiche n'Enugwu steeti nakwa steeti ndị ọzọ na Naịjirịa, ọ bụghịkwa nke mbụ ndị uweojii na-ekwe nkwa ịchọpụta ndị na-eme ya, mana ọtụtụ oge, onweghị ihe na-apụta na nnyocha niile ndị uweojii na-asị na ha na-eme.

Etu ndị a na-eche bụ ndị ọchịehi si gbuo ọtụtụ mmadụ n’Eha-Amufu, Enugu steeti

Aha onyonyo, Etu ndị a na-eche bụ ndị ọchịehi si gbuo ọtụtụ mmadụ n’Eha-Amufu, Enugu steeti

Ndị bi n’obodo Agu-Amede nke Mgbuji okpuruọchịchị Isi-Uzo, Enugwu steeti, nọ n’oke akwa arịrị dịka ndị a na-eche bụ ndị ochi ehi wakporo obodo ahụ na mbido izuụka a ma gbuo ọtụtụ ndị mmadụ.

Otu onye bi n’obodo ahụ kọwaara BBC Igbo na ya bụ ihe mere n’ụbọchị Mọnde mgbe ndị obodo Agu-Amede na-eme ọgbakọ ụmụnna ha.

O kwuru sị: “Dịka ndị a nọ n’ọgbakọ, ndị ojiegbe wụbatara n'obodo ahụ ma gbuo ọtụtụ ndị mmadụ aghara aghara ọkachasị ụmụnwoke.”

“Ha gburu ma ụmụaka nwoke e ku n’aka ma ndị okorobịa ụmụnwoke ma gbukwaa ụmụnwaanyị abụọ.”

N’ụbọchị Tuzde, ndị obodo Abom nakwa Mgbuji gbara ọsọ ndụ gbaga obodo ndị agbataobi ha dịka e kwuru na ndị ojiegbe ahụ wụbatara obodo ha ọzọ.

Ndị ọchị ehi na-achịrị ehi bata ọwụwa anyawụ Naịjirịa maka etu ahịahịa nakwa nrị ehi jiri jụpụta na mpaghara ahụ.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị ọchịehi na-achịrị ehi bata ọwụwa anyawụ Naịjirịa ịchọ ahịhịa maka ehi ha
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Onye obodo ahụ gwara BBC Igbo sị: “Anyị nọ n'ụjọ ugbua, ọtụtụ n’ime anyị agbafuola.”

Otu nwaanyị ọzọ bikwa nso n’Agu-Amede kọwaara BBC Igbo “Ọtụtụ ndị obodo Agu-Amede nakwa Mgbuji gbabatara obodo anyị n’ihi mwakpo a merenụ.”

“Anyị natara akụkọ n’aka ndị a gbara ọsọ na e gburu ụmụnwoke abụọ bụ ụmụ otu ụkọchukwu na-arụ n’ụlọụka ebe ahụ ma gbaa ya egbe.”

"Ndị a gbara ọsọ gwara anyị na ejiji ndị ojiegbe ahụ yiri ejiji ndị ọchịehi."

Kamgbe mbido afọ anụla ọtụtụ akụkọ mwakpo n’akụkụ ebe a.

Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ndị obodo abụrụla ndị na-enweghị ebe obibi n'ihi na ha agbaala ọsọ ndụ ha, hapụ ubi ha, ọrụ ha niile ma ụlọ ha gbaga obodo ndị ọzọ.

Bịshọpụ Daniel Olinya bụ onyeisi ụka Anglịkan n'Eha-Amufu onye mere njem ga hụ gọvanọ Enugu steeti n'ụbọchị Tuzde banyere mwakpo ndị a gwara ndị ntaakụkọ na obi dị ya mma n'ihe ha na gọọmentị kpara, na nkwa ndị ha nkwere nakwa onyinye ego enyere ndị obodo ahụ.

Ihe gọọmentị Enugu na-eme maka mwakpo ndị a

Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi zipụtara ozi iti aka n'obi nye ndị obodo a n'ụbọchị Tuzde.

Ebe foto si, Louis Amoke/Facebook

Nkọwa foto, Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi zipụtara ozi iti aka n'obi nye ndị obodo a n'ụbọchị Tuzde.

Gọọmentị Enugu zipụtara ozi n’ụbọchị Tuzde kwuo na ya bụ mwakpo mere n’ezie ma zịpụta ozi iti aka n’obi nye ndị ya bụ ihe metụtara.

Akwụkwọ ozi gọọmentị Enugu steeti kọwara na ya bụ mwakpo tara isi ọtụtụ ndị obodo a ma merụọ ụfọdụ n’ime ha ahụ.

Agbanyeghị na ha enyeghị ọnụọgụgụ ndị ya bụ ihe metụtara, ozi ha kwuru ha gọọmentị Enugu na-enye ezinaụlọ ndị ahụ ego nde naịra 10 maka iji leta ndị gbara ọsọ ndụ ha nakwa kwụọ ụgwọ nleta ahụike ndị merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ.

Gọọmentị Enugu nyere iwu ka ụfọdụ ndị ọchịchị gọọmentị ahụ gaa njem mgbarụ leta ndị ya bụ mwakpo metụtara.

Cheta na n'afọ 2021, otu ndị gọvanọ ndịda Naịjirịa jịkọrọ aka ọnụ kwuo na ga-amachị ọchịchị ehi na mpaghara hụ niile nke gụnyere Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.

Ozi ha nke kwuru na ya bụ mmachị ga-amalite n'ọnwa Sepụtemba 2021 kọwara na ha na-eme nke a iji chekwaa ndị nke ha dịka ọtụtụ mwakpo nakwa ọgbaghara n'aka ndị a na-eche bụ ndị ọchị ehi na-adapụta ugboro ugboro n'etiti ha na ndị obodo ebe ha na-achị ehi agafe.

Eboola ọtụtụ ebubo na ndị a na-eche bụ ndị ọchị ehi na-edu ehi ha wụba ugbo ndị mmadụ dịka ehi ha na-atapịasị ọrụ ugbo ndị mmadụ.