Ogbaru Herdsmen Attack: A tọọrọ ndị ọchịehi na ehi 300 ha n'Anambra? Lee ihe anyị ma

Ehi

Ebe foto si, Getty Images

Ndị ọchịehi ekwuola na ndị oji egbe tọọrọ ndị otu ha mmadụ iri nakwa ehi ha ruru narị atọ n'obodo Obene dị n'Ogbaru, Anambra Steeti.

Onyeisi Miyetti Allah Cattle Breeders Association of Nigeria (MACBAN) na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bụ Gidado Siddiki sị na nke a mere n'elekere otu nke isi ụtụtụ ụbọchị Satọde, 23 Eprelụ 2022.

Ọ sị na ndị ojiegbe ahụ wakporo ebe obibi ha dịka ha na-ehi ụra n'abalị ma tọrọ ndị otu ha na ehi ha.

Siddiki sị na ndị ntọrị ahụ akpọọla ezinaụlọ ndị ha tọọrọ ma sị ka e nye ha nde naịra anọ nakwa egbe tupu ha atọhapụ ha.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ gwala ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa Department of State Service (DSS).

Ihe ndị uweojii kwuru

Kọmishọna uweojii Anambra steeti bụ Echeng Echeng

Ebe foto si, Anambra Police Command

Mana mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra bụ Tochukwu Ikenga, ọ sị na Sakin ziteere ya ozi banyere ya.

"Akpọrọ m Sarkin n'ekwentị site n'ozi o ziteere m, agwara m ya gaa n'ụlọọrụ ndị uweojii dị ya nso mee mkpesa.

"Nke a ga-enyere anyị aka ime nnyocha ebe ọ bụ na ọ sị na ndị ntọrị a akpọọla ezinaụlọ ndị ha tọọrọ.

"Ọ ga-enyekwara ndị uweojii aka ịhazi onwe ha ọfụma, mee nnyocha ma zọpụta ndị a tọọrọ."

Ikenga gara n'ihu kwuo na kọmishọna ndị uweojii bụ Echeng Echeng na ndị otu ha ga-agba mbọ ịhụ na ha zọpụtara ndị a atọọrọ.

Nke a emeela ya ugboro abụọ a na-awakpo ogige ndị ọchịehi dị n'okpuruọchịchị Ogbaru n'ime otu izuụka.

N'ụbọchị Mọnde 18 Eprelụ 2022, akụkọ pụtara na ndị oji egbe wakporo ogige ndị ugwu bi n'Ogbaru ma gbuo ihe ruru mmadụ ise.

A gbatara ndị agha mmiri abụọ egbe dịka ha bịara ịlụsị ndị oji egbe ahụ ọgụ, dịka onye hụrụ ka ihe si mee ji kọọrọ BBC Igbo.

Akụkọ ka na-abịa...