A gbaala ụlọ Igwe Oliver Nnaji nke Ogwu Aniocha Anambra steeti ọkụ

Igwe Oliver Nnaji na ụlọ ya gbara ọkụ

Ebe foto si, Igwe Oliver Nnaji/BBC

Akụkọ si Ogwu Aniocha dị n'okpuruọchịchị Ogbaru n'Anambara pụta na-ekwu na a wakporo ma gbaa ụlọ eze obodo ahụ bụ Igwe Oliver Nnaji ọkụ n'ụbọchị Monde.

Otu onye bi n'obodo ahụ achọghị ka a kpọọ ya aha kwuru na a hụbeghi Igwe obodo ahụ anya rue ugbua.

Ọ gara n'ihu kwuo na a gbara ụlọ nwoke ọzọ bụ "PJ" ọkụ"

Akụkọ na-ekwu na o nwere ndị nwụrụ n'ọdachi ahụ.

Mbọ BBC gbara inweta olu nd i uweojii Anambara steeti amịtaghị mkpụrụ.

Ebe ndị agbara ọkụ n'Atani

OỌnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga azaghị ekwentị ya oge anyị kpọrọ ya tupu anyịụ wepụta akụkọ.

Gịnị butere ọgbaghara a?

Ebe ózó e mebiri na mwakpo ahú

Dịka nwoke ahụ sị gwa BBC Igbo, o teela aka a na-azọ onye ga-anọ n'oche Igwe n'obodo ahụ.

Mana nke butere mkpamkpa ọhụrụ a bụ mgbe ndị uweojii bịara kpụrụ ndị otu a na-akpọ "Lion Squad" bụ nke Igwe ochie obodo ahụ hibere.

Nke a bụ n'ihi nsogbu otu ahụ na-enye ndị bi ebe ahụ mana ha majara ndị obodo ahụ si na ebenebe ga-egbu maọbụrụ na atọghapụghị ndị otu ha e ji.

Aha onyonyo, Lee obodo enweghị ụzọ, miri na ọkụ na-anyụ ịkpakwụ n'Anambara

E nwere esemokwu dapụtara gbasara onye ga-anata ụgwọ ụtụ n'okporụzọ n'etiti ndị otu Lion Squad ahụ nakwa otu PJ ọzọ.

Esemokwu ahụ mechara ghọrọ ọgbaghara dịka ha gara be PJ gbaa ya ọkụ ma si ebe ahụ gaa bee Igwe gbaa ya ọkụ.

"A gbara Igwe egbe buru ya pụọ" ka nwoke ahụ kwuru nke pụtara na rue ugbua ahụbeghi ya anya.

Nwoke ahụ gwakwara BBC na ụjọ ji ndị mmadụ ị ga mee mkpesa n'aka ndị uweojii.

Onyeisi Vigilante obodo ahụ e gbukasịrị mma
Nkọwa foto, Onyeisi otu nche obodo ahụ ndị omekome gbukasịrị mma

Ihe ọzọ a kọọrọ BBC bụ na o nwere otu onye nche obodo akpọrọ Vigilante n'obodo ahụ nke egbukasịrị mma mgbe ọ gara ịme nchọpụta.

BBC Igbo ka na-anwa ịnweta ndị uweojii Anambra steeti maka okwu a.