New Anambra Burial Laws: Ihe 10 dara ụda n'iwu akwamozu ndị steeti a

Ebe foto si, APAMSLIMITED
Kamgbe ụnyahụ bụ ụbọchị iri na otu nke ọnwa Maachị ka iwu ọhụrụ nke akwamozu n'Anambra steeti ji ewu n'elu soshal midia.
Ọ bụ n'afọ 2019 ka omeiwu Charles Ezeani tụpụtara ya bụ iwu, tupu ụlọ omeiwu nke Anambra steeti suo ya kpọm na 2019 kwuru na ọ bụ iji mee ka oke ọnụ akwamozu na-ada na steeti ahụ datuo kpam kpam.
Ezeani kwuru na ọ chọpụtara na akwamozu kwesiri ịbụ oge iru uju bịakwaziri bụrụ ọnọdụ oriri na nkwarị.
O kwuru na iwu a ga-eme ka ndị mmadụ ṅụọ mmiri tọgbọ iko maka nsogbu ndị obodo na-enye ha ma ha na-akwa ozu.
Lee ihe o kwuru n'uju ebe a.
Lee ihe 10 gbara ọkpụrụkpụ n'ime iwu akwamozu ọhụrụ nke Anambra
- A ga-enwe otu ga-eme ihe niile ịhụ na edebere ya bụ iwu ma na-akwụ ha ụgwọ. Ha ga-anọkwa ebe a na-akwa ozu.
- Onye ọbụla dara iwu a ga-aga nga ọnwa isii maọbụ kwụọ ụgwọ ruru otu puku narị naira
- Umuada agaghị ananwu nwaanyị ọbụla na-akwa nne ya karịa naira puku iri
- Agaghị akwa ozu n'ụbọchị ndị obodo na-azụ ahịa
- Naanị egbe a ga-agba n'akwamozu bụ 'Nkpọnana'
- Ọ bughị iwu na ị ga-esi nri maọbụ kee mmanya ụbọchị a na-akwa onye nke gị
- Ị gaghị ahapụ ozu ọbụla karịa ọnwa abụọ na motuary
- Ndị nwe ozu ga-akwụ ụgwọ ha ji obodo maọbụ ụlọụka tupu eli ozu onye nke ha
- ị gaghị eji n'ihi na ị na-akwa ozu gbachie ụzọ ebe ndị mmadụ si agafe belụsọ ị na-atara nkwado n'aka ndị isi okpuruọchịchị
- Ị gaghị ekowe akwa na-egosi akwamozu ị na-akwado imee nanị ntuzi etu ndị mmadụ ga-esi rute ebe a na-akwa ozu
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka iwu a n'elu soshal midia.
@TauhidAfc kwuru na ọ ga-adị mma ka ndị mmadụ katọọ ụfọdụ ihe megidere omenala n'ime iwu a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Lee akwụkwọ iwu ahụ n'uju ebe a

Ebe foto si, Charles Ezeani

Ebe foto si, Charles Ezeani

Ebe foto si, Charles Ezeani

Ebe foto si, Charles Ezeani

Ebe foto si, Charles Ezeani






