Liverpool vs Atletico Madrid: Atletico efopụla Liverpool ka ahịhịa na Champions League

Ebe foto si, Getty Images
Nke a bụ agba nke abụọ n'asọmpi dị n'etiti Liverpool na Atletico Madrid maka onye ga-etozu ịga n'ihu maka asọmpi Champions League.
Ndị Liverpool bu n'obi ịbọgwara mmeri Atletico ji otu ọkpụ goolu merie ha na Madrid n'asọmpi nke mbụ ha.
Ọ dị ka nzube ndị Liverpool a ga-emezu dịka Georginio Wijnaldum nyere goolu nke mbụ na nkeji iri anọ na atọ.
Liverpool rụrụ ụlọ were biri na'ogige ọnụ postu ndị Atletico n'agba nke abụọ n'asọmpi a.
Ndọlị ndọlị ha mịtara mkpụrụ dịka Roberto Firmino ji isi ya kara aka were takaa neetị ndị Atletico na nkeji iri itoolu na anọ.
Ndị Liverpool agaghị echefu etu onye na-eche ọnụ poostu ha siri gbanye ndị Atletico bọọlụ n'ụkwụ nke mere ka ha were ohere a nye goolu mbụ ha n'aka Marcos Llorente.
Nke a gbara ndị Atletico ume dịka Llorente gara n'ihu nye goolu ọzọ na nkeji otu narị na ise.
Ọ bụ Alvaro Morata ji goolu nke atọ techuo Liverpool ihu mgbe ọ fọrọ ọkara ole na ole ka e gbuchie asọmpi a .









