Liverpool vs Manchester United: Liverpool agwọọla Man Utd ka ji mpataka

Ndí otu Liverpool na ManUtd

Ebe foto si, Getty Images

Ọ bụ na nkeji iri na anọ ka ndị otu egwu bọolụ Liverpool nwetara kọna nke Alexander-Arnold jiri chọta isi Van Dijk.

Ọ bụ nke bụ gọọlu mbu na asọmpị a.

Na nkeji iri abụọ na ise, ndị Liverpool nyekwara goolu ọzọ kama ihe onynyo VAR kagburu ya.

Mana ụfọdụ na asị na ọkwesịrị ị bụ goolu.

Na nke yiri ibe ya bụkwa na nkeji iri atọ na isii ka ndị Liverpool nyekwara goolu ọzọ kama ogbu opi kagburu were sị 'off side'.

Ndị Manchester United gbara mbọ lịka lịka ịsata goolu ahụ mana onweghị isi.

Liverpool gosiri ha nkarị dịka ha nyere goollu nke abụo mgbe ọ fọrọ nkeji abụo ka egbuchie asọmpi a.

Dịka ọ dị ụgbụa, Liverpool ka nọsịrị ike n'ọcheeze ha na EPL.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Biafra at 50": Kaduna Nzeogwu na-ebugharị ogbunigwe n'akpa ya mgbe ọ dị ndụ"