Man United vs Liverpool: Ndị Man Utd a ga-atụpụrụ Jurgen Klopp ọnụ?

Ebe foto si, Getty Images
Ndị Man Utd unu a ga-eyiri ọbante jee ọgụ?
Aka na-achịkọta Liverpool bụ Jurgen Klopp na-agba egbe ọnụ maka ihe ọ na-eche na ndị otu ya ga-eme Man Utd n'ụbọchị ụka.
Klopp kwuru na ya ma na ndị Man Utd na-ekwu okwu igbanwe ọnọdụ ha, mana ọ sị ha cheretukwuo otu izu (ka ha kụzichaara ha ihe) tupu ha amalite ya bụ mgbanwe.
O kwukwara na "echeghị m na e nwere ọtụtụ otu egwuregwu ga-achọ izute anyị ka ọ dị ugbua".
Ma sị " Man Utd nọ n'ọnọdụ na-amasịghị ha, ha chọkwaranụ ịgbanwe ya. Anyị ga-agba mbọ ịhụ na mgbanwe ahụ ha na-achọ ga-amalite n'izu na-abịa nụ (mgbe anyị zutechara). Ọ gwụchaa!"
A chụọla osote gọvanọ Kogi steeti ụkwụ eru ala

Ebe foto si, Twitter/@lugardhouse
Simon Achuba ga-anọ n'ịta ikikere eze ugbua dịka ndị ụlọomeiwu steeti ya gbakọrọ aka chụtuo ya n'oche.
Ha boro ya ebubo agwa ọjọọ nakwa ihe ndị ọzọ.
Cheta na Achuba na Gọvanọ steeti ya na-ese okwu kemgbe.
Ebee ka nwoke a ga-esi bido ebido?
Otu nwoke nọ eche ụwa ya ugbua ka ọkụ Ọchanja napụrụ ya ụlọahịa ya, nke gbara n'Ọmọba anapụ ya ụlọobibi ya nakwa ụgbọala ya.

N'agbanyeghị na mmadụ anwụghị na nke Ọmọba, ụzụ akwa na-atụ n'ihi na ụlọ na ụgbọala gbachara ọkụ.
N'isi ụtụtụ, ndị bi n'Ọmọba Ọnịcha tetara ụra n'elekere atọ nke isi ụtụtụ dịka tanka bu mmanụ ụgbọala dara ma wụsasịa ihe o bụ n'ala.
Ya bụ mmanụ ghọrọ ọkụ dị ka nke Ọchanja siri mee.
Lee ihe ndị mmadụ gabigara n'ọkụ abụọ gbara n'Ọnịcha n'otu izu.
Ogbunigwe alaala ndị mmadụ n'iyi n'Afganịstan

Ebe foto si, EPA
Ihe karịrị mmadụ iri isii anwụọla ebe ọtụtụ merụrụ ahụ dịka ogbunigwe gbapụrụ n'ụlọekpere alakụba na mba Afganịstan taa.
E nwebeghi ndị kwere na ọ bụ n'aka ha ka mwakpo ọjọọ a si.
Ndị Shiite aghaala ike n'anwụ ọzọ
Akụkọ si Abuja eru anyị ntị na-ekwu na ndị uweojii ji anwụrụ ose wee chụsasịa ndị otu Alakụba a kpọrọ Shiite mgba ha mere ngagharị iwe n'ehihie taa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ndị otu Shiite ka na-akpọ oku ka a tọhapụ onyeisi ha bụ Ibrahim El-Zakzaky nke gọọmentị etiti ji kamgbe afọ 2015.
Ndị ọrụ na gọọmentị achabiela ehi ọdụ

Ebe foto si, Festus Keyamo/Twitter
N'ikpeazụ nghọtaghie dị n'etiti ndị ọrụ na gọọmentị etiti abịala na njedebe dịka ha nwere nkwekọrịta na ya.
Dịka nzuko ha nọ na-aga n'ihu, mịnịsta steeti na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Festus Keyamo dere ya n'akara Twitter.
O dere "Site na mkparịta ụka gọọmentị na ndị ọrụ, ha ekwekọrịtala na nhazigharị puku naịra iri atọ ụgwọ ọnwa opekatampe ọhụrụ."
Onyeisi otu a kpọrọ 'Trade Union Congress' bụ Quadri na odeakwụkwọ ya bụ Musa-Lawal Ozigi sị na nke a bụ eziokwu.
Ha kelere gọọmentị na ndị ọrụ maka inwe ndidi na mkparịta ụka ha iji nwe nkwekọrịta.
A ga-eji pasentị 23.2 bulie ego ndị nọ n'ogogo 7, pasentị 20 n'ogogo 8, pasentị 19 n'ogogo 9.
Pasentị 16 maka ndị nọ n'ogogo 10 ruo 14, pasentị 14 na ndị n'ogogo 15 ruo 17.
Nkwekọrịta ha na-abịa dịka ụbọchị otu narị na iri asatọ na abụọ gachara onyesiala Buhari tinyere aka na ya.
Ụgbọala Tanka ọzọ agbaala ọkụ n'Ọmọba Ọnịcha

Nwanna ọkụ a gbara n'Ọnicha ka bụkwa okwu akpụ n'ọnụ dịka ọtụtụ ihe onyonyo na-apụta na soshal midia.
Dịka a na-ekwu nke a, ụgbọala Tanka ọzọ dara ma gbaa ọkụ n'okporoụzọ Ọmaba Phase 1 nke Ọnịcha na mgbede ụnyaahụ.
Mana ndị uweojii site n'ọnụ onye na-ekwuru ha bụ Haruna Mohammed sị na o nweghi onye nwụrụ n'ọkụ a gbara.
Mohammed kwuru na ha ebupụla ụgbọala Tanka a n'ụzọ ka ọ ghara igute kpachi kpachi okporoụzọ.
Onye ntaakụkọ anyị gara ebe ahụ sị na ọ bụ mposi ka eji gbanyụọ ọkụ ebe ụfọdị ebe ndị ọrụ gbata gbat enweghị mmiri.
Idemmiri emeela ndị mmadụ ịwa na Gana

Ebe foto si, My JoyOnline
Ihe ruru mmadụ iri abụọ na asatọ anwụọla ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ n'ihi oke mmiri ozuzu zoro ụbọchị asatọ na Gana
Ihe karịrị ụlọ otu puku alariela n'iyi, mana n'agbanyeghi nke a egwu ka dị na ọnụọgụgụ ndị o metụtara ka ga-arị elu.
Ed Woodward enweela iwe

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi otu egwu bọọlụ Manchester United bụ Ed Woodward sị na ọ bụ mkparị ị sị na ndị na-abụghị ndị boolu na-eme mkpebi n'ihe gbasara bọọlụ.
Cheta na a sị na Woodward na-etinyekarị anya n'okwu ndị nchịkọta Man United.











