West Ham vs Man United: E tiela Man United ka ịgba udubọnch

Ebe foto si, Getty Images
Ihe na-ebe ka na-ebe n'ụlọ ndị Manchester United nọ dịka West Ham United ji ọkpụ goolu abụọ merie ha n'asọmpi Premier League.
West Ham kpọbatara Man United n' ụlọ ma were ọkpụ goolu abụọ asataghị otu kụọ ha ihe okenye kụrụ nwata dịka ụmụaka.
Nke a malitere mgbe Andriy Yarmolenko nke West Ham ji goolu mba maa Man United aka ntị na nkeji 14.
Man United siri ọnwụ dịka nkịta a na-achọ igbu mana West Ham kelara aka n'azụ.
Nke a megidere ruo n'ọkara nke abụọ n'ime asọmpi a mana Onweghi onye nyere ibe ya goolu ọzọ.
N'ime nkeji 84 ka ọ fọrọ nkeji isii ka e gbuchie bọọlụ, West ham nyere goolu nke abụọ site n'aka Aaron Cresswell.
Site na mmeri a, West Ham United bụ ndị anọ n'ogogo tebụlụ ebe Man United bụ ndị asaa.






