Igbo Folktale: Ihe ụmụ anụmanụ pụtara n'akụkọ ifo Igbo

- Onye dere ya, Jessica Nwankwo
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos
Akụkọ ifo Igbo bụ otu njirimara ndị Igbo ha ji agbasa ozi maka ihe dị icheiche.
Ịmaatụ eji akụkọ ifo akuzi amamihe, eji ya akọ akụkọ oge gboo, eji ya enye ndụmọdụ wdgz.
Ụfọdụ oge, akụkọ ifo na-eji ụmụ anụmanụ a ma atụ n'ime ya iji gosi agwa ọma maọbụ agwa ọjọọ nakwa ịmụta ihe.
Osita Amakeze bụ onye odeeakwụkwọ kọwara anyị maka ndị kachasị apụta n'akụkọ ifo na ihe e ji mara ha.
Mbe

Ebe foto si, Getty Images
Mbe bụ otu anụmanụ a ma ama na-apụtakarị na akụkọ ifo Igbo dị icheiche
Maazị Amakeze kwuru na ọ bụ aghụghọ ka eji mara mbe.
Ị chetara akụkọ mbe na nkịta na nti ele?
Enyi

Ebe foto si, Getty Images
O kwuru na ihe eji mara Enyi bụ ibu n'ihi etu ọ ha.
Enyi abụghị anụmanụ dị obere ma ncha ya mere ụmụ anụmanụ ibe ya jiri na-agụ:
"Enyi na-aga n'anyị so gị n'azụ"
Agụ/Ọdụm

Ebe foto si, Getty Images
Ụfọdụ akụkọ na-ewe agụ na ọdụm ka ha abụ otu ihe n'ihi na ha yiri onwe ha.
Ha nwekwara agwa yiri ibe ya nke bụ na eji ike mara ha.
Ị lebanye anya n'akụkọ ifo ụfọdụ, ị ga-ahụ na ọ bụ agụ na ọdụm ka e chere kachasị ike.
Awọ

Ebe foto si, Getty Images
Ndị Igbo tụrụ ilu sị na "akụ fechaa ọ dara awọ"
Nke a mere ejiri jiri ndidi mara awọ.
O nwere anụmanụ ọzọ yiri awọ nke Igbo kpọrọ Mbala.
Omume ha yiri mana ha abụghị otu ihe.









