Marriage Proposal: Nwoke lakpuru n'ime mmiri ịjụ enyi ya nwanyị ya maka ọlụlụ emiela na mmiri ahụ

Kenesha na Weber

Ebe foto si, KENESHA ANTOINE ON FACEBOOK

Nkọwa foto, Ndị uweojii Zanzibar na-enyocha etu Weber si nwụ

Akụkọ na-agba anya mmiri mere dịka nwoke onye mba Amerịka mirilara na mmiri ka ọ na-ajụ ọyị ya nwaanyị ma ọ ga-alụ ya n'ime mmiri ahụ.

Steven Weber na ọyị ya nwaanyị, Kenesha Antoine gara nọdụ n'ụlọ oriri na nkwarị dị n'okpuru mmiri nke dị na Manta Resort, n'akụkụ Pemba Island na mba Tanzania.

Ihe nkiri ọyị ya nwaanyị bụ Antoine wepụtara gosiri ka Weber si makpunye n'ime mmiri ahụ, wepụta akwụkwọ ebe o dere ya bụ arịrịọ nakwa ọla aka mana tupu Antoine asacha ajụjụ ọlụlụ, mmiri agbagbuola enyi ya nwoke.

Antoine na Weber

Ebe foto si, KANESHA ANTOINE

Ọyị ya nwaanyị depụtara maka ọnwụ ya na soshal midia (Facebook) kwuru na ọ pụtaghị na mmiri ahụ tupu ọ nwụọ.

Onyeisi ụlọ oriri na nkwari ahụ bụ Matthew Saus kwuru na ọnwụ Weber wutere ma nye ndị ụlọọrụ ya ahụ ọmajiji.

Ụlọ oriri na nkwarị

Ebe foto si, THE MANTA RESORT

Nkọwa foto, Ndị uweojii Zanzibar na-enyocha etu Weber si nwụ

O kwuru na mgbe ndị ụlọọrụ ya ji chọpụta ihe na-eme, ihe e mebiela nke ukwu.

Etu o si mee?

Mazi Weber na ọyị nwaaanyị hazichara etu ha ga-esi wee rahụ n'ụlọ ndịna dị n'ụlọ nkwarị ahụ dị n'okpuru mmiri rue abalị anọ.

Ụbọchị nke atọ, ọ gawa ịrịọ ọyị enyi ya nwaanyị ma ọ ga-alụ ya n'okpuru mmiri.

Mmiri

Ebe foto si, KENESHA ANTOINE

Nkọwa foto, Kenesha na Weber gara njem nleghari anya mgbe ọdachị a mere

Ka o na-eme nke a , o yi ugogbe anya e ji egwu mmiri, jide akwụkwọ o ji dee ya bụ arịrịọ nọrọ n'akụkụ mpio ebe ọyị ya nwaanyị nọ n'ime ụlọ ndịna ha na-esete ihe o na-eme.

Ihe e edere n'akwụkwọ ahụ Weber ji pụtara bụ nke a: "Enweghị m ike ijide ume m oteaka iji gwa gị ihe niile mere m ji hụ gị n'anya, mana... Ihe niile m hụrụ n'anya n'ebe ị nọ. A hụrụ m gị n'anya ụbọchị niile."

Akwụkwọ

Ebe foto si, KENESHA ANTOINE ON FACEBOOK

Nkọwa foto, Akwụkwọ Weber ji jụọ Antoine 'ị ga-alụ m'

Ọyị ya nwaanyị dere na Facebook ya na ihe ọkara ịza ajụjụ ị ga-alụ m ọyị ya nwoke kara ị bụ "eeh...nde kwuru nde."

Antoine kwuru na ihe na-akasị ya obi bụ na ha abụọ nọkọrọ tupu ọ nwụọ.

Ka ọ dị ugbua, ụlọọrụ US na-ahụ maka ọnọdụ ndị be ha n'ofesi ekwuola na ha ma maka ya bụ ọnwụ ma na-eti ezinụlọ Weber aka n'obi.

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Ihe nkiri a ga-amasị gị

Aha onyonyo, Idu Okwuosa