Onitsha tanker explosion: Tanka nsi bụ ihe e jiri menyụọ ọkụ n'Onitsha

Kirie ihe onyoonyo ebe ndị mmadụ ji mmiri 'pure water' na-ebuso ọkụ a agha:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Tanka bu mmanụ ụgbọala awụfuola ma nwuru ọkụ nke bidoro gbawa kamgbe elekere iri na abụo nke oke ụtutụ taa n'Ọnisha.

Ebe foto si, PoliceNG
Ndị uweojii kwuru na ha amabeghi mmadụ ole ọkụ a rere, mana ha ebusoola ọkụ a ọgụ n'iji menyụọ ya mana ọ ka pere mpe fọrọ.

Ebe foto si, NGRPolice
Ọkụ a bidoro na 'Upper Iweka' were ruo Ọchanja nke di n'Ọnịcha.
Ọkụ a gbara rutere ahia Ọchanja na 'Relief' nke dị na Ọnịcha.
Ihe ndị Uweojii kwuru

Ebe foto si, NGRPolice
Ndị uweojii ekwuola na ọkụ a ataala isi nne na nwa ya obere.
Ha sị na o bidoro n'ihe dịka otu nkeji tupu elekere otu akụọ (12:59) nke ehihie ka Tanka a dara were kwafuo mmanu ụgbo ala n'ime ọwa mmiri.
Ihe onyeisiala Buhari kwuru:
Onyeisiala Buhari gbarụrụ ihu n'ọnwa otu nwaanyị na nwa ya n'ọkụ ọgbụgba a.
N'okwu ya "O metụrụ m n'obi mgbe m hụrụ ahụ nwaanyị na nwa dịka ọkụ repịara ha n'ihe mberede a".
Ọ gakwara n'ihu kele ndị ọzọ nke nwe ụlọọahịa, ụlọ obibi, ụgbọala ọkụ a metụtara.
Onyeisiala Buhari nyere iwu ka minista maka ime njem nakwa ụlọọrụ na-ahụ maka ime njem n'udo ka ha gbaa mbọ lebanya n'okwu banyere nchekwa njem okporoụzọ.
Ihe Gọvano Willie Obiano gwara ndị Anambra
1) Obi dị ya nwute maka ihe mere ọkachasi nne na nwa ọkụ a gburu.
2) ndi ọru ha bu imenyụ okui bụ ' Anambra state Fire service' biara n'ọge, mana ndị iwe na ewe ekweghi ka ụfodu n'ime ha gafee.
3) O kwuru ka ndị niile ọkụ a gbara ihe kụ bia na ụlo gọọmenti n'ụbochị Mọnde nke iri abụo na otu ọnwa Ọktoba.
4) A ga-ehibe nzụko ga-achopụta ihe kpatara oku a n'ezie
5) Gọvanọ Obiano si na ezinulo ya niile na ekpere ndi nwụru ekpere ma kwuo kwa na ha ga-enyere ezinụlo ha aka were lie ha.
N'igwe soshial medịa, ndị mmadụ na-ekwu na ma ụlọahịa ndị mmadụ ma ụgbo ma ụlọ na-erefu n'ọkụ a dịka @Josahyah siri gosi:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Mana mgbe @Maxie_IsAwesome denyere n'ozi ya, ọ kpọkụrụ ndị mmadụ ka ha na-ekpere ndị dị nso ka ha gbata ọsọ enyemaka:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
@Nonny_marshal dere na ọkụ a ferela n'Ọchanja na Fegge:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3











