Ọ pụtara na ndị na-anya tanka mmanụ karịrị gọọmentị?

Ebe foto si, Lasema
Ndị mmadụ ka na-agụkọ ihe ha tufuru n'ihe mberede okporoụzọ mere ụbọchị Tọọsde, abalị 29 nke ọnwa Juun, afọ a, ebe mmadụ itoolu tufuru ndụ ha n'ọkụ ọgbụgba.
N'ihe mberede ahụ, ụgbọala 54 gbara ọkụ ka ụgbọala mmanụ kwopụrụ n'ike daa ma nwuru ọkụ n'okporoụzọ.
Ọ bụghị sọ na Legọs, ụgbọala mmanụ ataala isi ọtụtụ mmadụ na Naijiria ọkachasị n'obodo mepere emepe n'ihi amaghị eme nke ndị na-akwọ ya.
Ndị na-akwọ ụgbọala mmanụ na nnukwu ụgbọala yiri ya na-eme ka mmawụ na-eti onwe ha, dịka ọtụtụ n'ime ha anaghị erube isi n'iwu gbasara njem okporoụzọ.
Na Legos, enwere iwu gọọmentị mara n'oge ọchịchị Babatunde Fashola, nke kwuru ka ndị ụgbọmmanụ na ụgbọala gwongworo na-aga n'okporoụzọ naanị n'abalị.
Onye Kọmishọna mgbasa ozi dị n'aka ya na Legọs steeti bụ Kehinde Bamigbetan, gwara BBC na ndị na-akwọ ụgbọala mmanụ na ndị nwe ya na-eme ka ha akarịrị iwu ala anyị.

Ebe foto si, Lasema
O kwuru na mmachi nke gọọmenti steeti a n'oge Fashola machiri ụgbọala mmanụ ịga n'ehihie enweghị iwu kwadoro ya, nke mere na gọọmenti agaghị akpụpụli onye dara ya ụlọikpe.
Bamigbetan kwuru na mbọ gọọmenti steeti a gbara iso iwu ahụ n'ọkụ butere ọgbaghara dịka ọ kọwara na otu ọkwọ ụgbọala gburu onye ọrụ ngalaba steeti na-ahụ maka ịhazi njem okporoụzọ nke a kpọrọ 'Lagos State Traffic Management Agency (LASTMA), na bekee, okwu ikpe ya ka dị n'ụlọikpe.
Mgbapụ na nsogbu a dị Gọọmenti etiti n'aka
Bamigbetan kwuru n'ihe ga-egbo ọgụ a bụ "Gọọmenti etiti na ndị ọkwọ ụgbọala mmanụ na ndị nwe ya itinye ụkwụ n'otu traụza n'ihi ha na-agwakarị anyị na ha anọghị okporoụzọ nke Legos steeti."
Ọ gara n'ihu kwuo na ikike okporoụzọ awara awara dị gọọmenti etiti na ngalaba nhazi njem Federal Road Safety Corps (FRSC) n'aka, ịhụ na ndị ọkwọ ụgbọmmanụ natara ọzụzụ na akwụkwọ zuru ezu maka ịkwọ ụgbọala nakwa nyocha ịhụ na isi zuru ha oke.

Anyị ga-akpụpụ onye ọkwọ ụgbọala ụlọikpe-FRSC
Onyeisi ngalaba gọọmenti etiti na-achịkọta nchekwa njem ụgbọala nke a kpọrọ Federal Road Safety Corp (FRSC) na bekee bụ Hyginus Omeje, kwuru na gọọmenti ga-akpụpụ ụlọọrụ nwe ụgbọmmanụ ahụ nwuru ọkụ ji gbagbuo mmadụ itoolu ụlọikpe.
"Anyị ga-akpụpụ ha ụlọikpe."

Ebe foto si, Lasema
Ihe mere dị anyị obi mwute-Nupeng
N'aka nke ọzọ, otu jikọrọ ndị ọrụ mmanụ nke a kpọrọ Nigeria Union of Petroleum and Natural Gas workers (NUPENG) na bekee kwuru na ọdachi ahụ dị ha obi mwute.
Onyeisi NUPENG n'ọdịda-anyanwụ bụ Tayo Aboyeji, gwara BBC na ha kwara arịrị maka ihe mberede ahụ ma soro ezi na n'ụlọ ndị ometụtara n'iru uju.
"Otu ndị na-akwọ ụgbọmmanụ (Tanker Association Union) na ndị NUPENG na-ata onwe anyị ụta maka ihe a mere nke mebiri ihe otu a. Anyị na eti ezinaụlọ ndị ihe a metụtara aka n'obi."
O kwuru na ha na ndị ọrụ FRSC na-akparịta maka nchekwa ndị njem ma tụọ arịrị na ndị agboro na-achọ ịnapụta ndị otu ha na-eme njem abalị ego, so ebute ọdachi okporoụzọ.









