Mmadụ 7 anwụọla n'ọkụ tanka gbara n'Anambra

Ebe foto si, Anambra Police
Mmadụ asaa n'ime mmadụ asatọ anwụọla ka ọkụ tanka gbara n'Amawbia dị n'Awka.
Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Anambra state kwuru na ọkụ a gbara ụgbọala ruru asatọ ma mebie ụlọ na ụlọ ahịa ha agụtabeghị ọnụ.
Haruna kwuru na ihe mberede a n'elekere asatọ n'ụma nke abalị Februwarị asatọ n'okiri okiri Amawbia dị n'Awka.

Ebe foto si, Anambra Police
N'ọkwu ya, "onye ọkwọ ụgbọala ahụ bụ mmanụ ugbọala na-achọ ka ọ gafee okiri okiri , wee nọrọ n'etiti mgbagoju anya, ụgbọala ya wee gbahapụ nwuru ọkụ.

Ebe foto si, Anambra police
O kwuru na ebugala otu onye ka dị ndụ n'ime ndị ọkụ tanka a gbara n'ụlọ "Nnewi Teaching Hospital".
Haruna kwuru na ya na ndị otu ya nọ na-akwalisi ihu ebe ihe a mere ka ụzọ were gara ndị ọzọ were were.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị





