Minimum Wage: Buhari mee ọsịsọ ka ndị omeiwu tinye ọnụ - NLC
Akụkọ dị mkpa taa.
NLC
Ndị otu "Nigerian Labour Congress (NLC)" arịọla onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọ gbaa mbọ hụ na o nyere ndị ụlọomeiwu akwụkwọ mbụli ego opekatampe o kwere na nkwa, ka ha nwee ike mezuo ya ọsịsọ.

Ebe foto si, AFP
Peter Eson-Ozo bụ odeakwụkwọ NLC kwuru na ha na-ekwe ndịọrụ Naịjirịa nkwa na mgbe akwụkwọ ahụ ruru ụlọomeiwu, na ha ga-ahụ isi ya.
Ndị NYSC Enugwu
Aka na-achị Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi, ekwela nkwa na ndị na-efe ala nna ha niile ga-esonye n'usoro ntuliaka 2019 na steeti ya, ga-anata nchekwa pụrụiche.
O si n'ọnụ Josef Udedi bụ kọmishọna na-ahụ maka egwuregwu na steeti ahụ kwuputa nkea ka ndị na-efe ala nna ha n'Awgụ si n'ogige ha na-apụta.
Na mba ofesi,
Mmadụ anọ fọrọ n'ime iri asatọ na otu ndị ntọ tọrọla n'obodo Bamenda dị na Kamerun, apụtala.

Ebe foto si, Reuters
Ruo ugbua, amabeghị ndị tọrọla ha, makana gọọmentị na-ekwu na ọ bụ ndị isi ekwe ọnwụ si na mpaghara Kamerun na-asụ Bekee, mana ha agọrọla aka ha sị na ha amaghị maka ya.
N'egwuregwu,
Otu West Ham na-akwado ilele ahụike Samir Nasir gbabuuru Arsenal na Manchester City bọọlụ.

Ebe foto si, Getty Images
Cheta na a machiri Nasir ịgba bọọlụ ọnwa iri na asatọ, ka a chọtara ọgwụike n'ahụ ya.
Nyocha Diezani

Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka ego bụ EFCC ekwuola na ha ebidola atụmatụ ga-eme ka onye bụbu minista mmanụ agbịdị bụ Diezani Alison Madueke laghachite Naịjirịa.
EFCC na-achọ ka ọ lata bịa zara ọnụ ya maka ebubo na o zuru ego dị dọla ijeri iri itoolu mgbe ọ nọ n'ọkwa dịka minista.
Ọzọ

Ebe foto si, Hope Uzodinma/Facebook
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ndị uweojii anwụchiela Hope Uzodinma n'ọdọ ugboelu nke Abuja n'abali ụbọchị ụka maka n'ụlọọrụ ya arụghị ọrụngo nke ngalaba NPA nyere ha..
Mana onyeisioche APC n'Imo steeti bụ Dan Nwafor kwuru na ha anụbeghi ya bụ akụkọ.
Na mba ofesi

Ebe foto si, Reuters
Ọkụ na-agba n'ọfịa obodo Kalifonia egbuola ihe ruru mmadụ iri atọ n'otu.
Ọkụ ahụ nke bidoro kemgbe ụbọchị tụsde achụpụla ihe ruru mmadụ puku narị abụọ na be ha ebe ndịọrụ gbatagbata ka na-achọ mmadụ narị abụọ.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Otu super eagles nke Naịjirịa ekwuola na ha ga-ebido nkwado maka ịtozu asọmpị AFCON n'Asaba n'ụbọchị taa bụ Monde.,
Ha na-akwado ịzute Bafana Bafana nke Saụt Afrịka n'ụbọchị satọde n'abịa.
Nkeji:
Ihe nkiri












